Ọgụ ịkwụsị nyocha iji chọpụta ma nwaanyị amaghị nwoke

Mgbe e biputara ya

Anita, onye gbara afọ iri abụọ na abụọ kwuru n' oge ọbụla ya chetara agbamaakwụkwọ ya afọ abụọ gara aga, anya mmiri na-eju ya anya.

Dika ụmụ nwanyi ndị ime obodo Kanjarbhat - nke nwere mmadụ narị 200,000 ndị bi na mpaghara Maharashtra - a manyere Anita ka o me nyocha iji mara na ọ ma maọbụ na ọ maghị nwoke n'abalị agbamakwụkwọ ya.

Nyocha ọnọdụ amaghị nwoke bụ otu n'ime ihe ndị a na-eme n'ime obodo ahụ.

A na-enye di na nwunye lụrụ ọhụrụ akwa ọcha kpọga ha ụlọ-nkwari nke ndị isi obodo maọbụ ndị ezinaulọ ha wepụtara ka ha dina, ebe ndị ezinaụlọ ha abụọ ga-anọ n'ilo na-eche ha.

Ọ bụrụ na nwata nwaanyị ahụ gbaa ọbara, a mara na ọ bụ agbọghọ na amaghị nwoke. Mana ọ bụrụ na ọ gbaghị , ihe so ya dị egwu.

A na-enye ụmụnwoke ikike igba alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ha egọsibụtaghị na ha dị ọcha, meebọọ ụmụnwaanyị ndị dị otu a, ebe ndị ezinaụlọ ha na etikwa ha ihe maka imechu ha aha.

Omenala na-aga n'ihu agbanyeghị na ọtụtụ ndị ọkachamara kwuru na nkwenye na nwaanyị ga-agba ọbara ụbọchị mmekọ mbụ ya abụghị eziokwu.

Otu dọkịta na-ahụ maka zahụike ụmụnwanyị nke bi na Delhi kwuru sị:"O nwere ọtụtụ ihe nwere ike mee ka nwanyi ghara ịgba ọbara ụbọchị mmekọ mbụ ya."

Ọ gara n'ihu sị: "Ọ bụrụ na nwaagbọghọ emele egwuregwu rinne, maọbụ runye onwe ya aka maka inweta ụtọ, onwere ike ọ gaghị agaba ọbara. Ndị dị obiumeala nwekwaara ike i dina nwanyị ya na mmekọ mbụ na emepụghị ya ọbara."

Dịka o siri dị, Anita matara na nyocha agaghị adaba n'ihi ya na di ya anọkọla tupu agbamaakwụkwọ. Mana ihe sotere nke a abụghị ihe ọtyụrụ anya.

Ọ sịrị: "Echere m na di m ga-azọ m n'ihu ndị isi ala obodo, mana mgbe ha jụrụ ma mụ adị ọcha ka na mụ adịghị ocha, ọ tụrụ ha aka akwa ocha ahụ nke emetọghị ma sị na mụ aghị ya."

"Agwa gbakwojuru m anya n'ihi na ọ bụ ya gbara isi akwara na anyi ga-enwe mmekọrịta nke anyị merela onwa isii tupu anyị gba akwụkwọ."

"Ndị isi obodo kọrọ m 'onye adịghị ọcha' ma hapụ laa,ọfọdụ sọọsọ m. Ebegburu m onwe ma n'akwa ụbọchị ahụ"

Ndị uwe ọjii manyere di Anita, onye nke chọrọ ka ọgba ya alụkwaghịm maka na ọ 'dara' nyocha ahụ ka lụrụ ya na-aga n'ihu mgbe ndị ọgụ ikike diri onye tinyere ọnụ na ọkwụ ahụ.

Mana Anita kọwara na dị ya na-emegbu ya; ọ na eti ya ihe ma na-emechu ya ihu.

Ọnọdụ ha kawara njọọ mgbe ndị isii obi machiri ha iga-ihe emume obodo.

Anita kwuru: "Nsọgbụ ebelataghị mgbe dị ime n'\ihi na dị m na-ajụ m: "Nwa onye ka ọ bụ?" Ndị isi obodo na-ajukwa ya otu ajụjụ ahụ."

Ka ọnwa abụọ gachara, achụpụrụ ya na nwa ya ọhụrụ n'ụlọ di ya. O kwara ga be nne na nna ya.

Anita kwuru na ikpa onke ana akpa maka nyọcha mere na ụmụnne ya nwaanyị anyị nke na ha ahụghị onye ga-alụ ha.