You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Mee 25, 2026
Akụkọ dị mkpa - Mee 25, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Atiku Abubakar, Rotimi Amaechi na Mohammed Hayatu-Deen bụ mmadụ atọ ga-ama aka na ntuliaka imeụlọ pati African Democratic Congress (ADC) ga-eme n'ụbọchị Mọnde abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee 2026 iji họpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala n'afọ 2027.
- Onyeisioche pati ADC bụ David Mark kwuru na a ga-eme ntuliaka imeụlọ ahụ na steeti iri atọ na isii dị na Naịjirịa ma kpọọ oku ka ndị otu pati ADC niile ga-esonye na ntuliaka ahụ ma rube isi n'iwu pati ha iji kwalite udo.
- Ụlọọrụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC) adọọla aka na ntị ma kwuo na ọrịa Ebola nwereike ịbata Naịjirịa n'ihi etu ọrịa ahụ si etiwapụ na mba DR Kongo nakwa Yuganda.
- N'agbanyeghị na enwebeghị onye butere ọrịa ahụ na Naịjirịa, onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Jide Idris kwuru na nnyocha ha mere gosiri na ọrịa Ebola na-efesa n'ike n'ike ma kwuo na ọ dị mkpa ka e kee nkwụcha n'ebe ndị si mba ofesi abata Naịjirịa nọ.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.