Etu emume ụzọ iyi nke afọ 2022 si chakee

Aha onyonyo, Etu emume ụzọ iyi nke afọ 2022 si chakee
Mgbe e biputara ya

Emume Ụzọ iyi nke afọ 2022 n'Uke chakere ọfụma dịka ndị okenye obodo ahụ si kwu.

Ha kọwara na Ụzọ iyi bụ ụzọ arụsị.

Uzo iyi na-ebido n'ụbọchị Eke ma nọrọ ruo

Ọ bụrụ na emeghị ụzọ iyi, agaghị amalite ịkọ ji maọbụ ede.

Mmọnwụ dị iche iche na-agba n'iro ma a na-eme ụzọ iyi n'Uke.

Emume a na-ejikọta ndị Uke niile mee ka ha biri n'udo.

Kedụ ka Uzọ iyi si malite n'Uke?

kwuru na oge ndị Uke na-achọ chi ha ga-eji na-eje mmụọ, otu mmụọ akpọrọ Obiaja zutere onye Uke ma gwacha ya ihe ọ gwara ya, tupu ọghọ ajaa.

Ndị okenye nọ n'Uke kwuru na kamgbe obodo ahụ hapụrụ omenaala Uzọ iyi, ụmụaka na-anwụchasị, ihe ubi anaghị emecha ọfụma.