Charly Boy ekwuola na ọ chọrọ ndị ntoroọbịa pụrụiche maka ịchị Naịjiria

Aha onyonyo, Charly Boy: Iwe m n'ebe Gọọmenti nọ
Mgbe e biputara ya

Onye ama ama dịka Eze ndị ntoroọbịa na Naịjirịa bụ Charly Boy kwuru na obi adịghị ya mma maka ọnọdụ Naịjirịa.

Mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ, ọ jụrụ "Gịnị mere o jiri bụrụ ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa?".

Charly Boy kwuru na ọ na-achọ ndị ntoroọbịa pụrụiche ọ ga-akwado maka ị were oche ọchịchị Naịjirịa.

"Ọbi na-agwa m kamgbe afọ iri atọ na ise gara aga na nzọpụta Naịjirịa ga-abụ maka ndị ntoroọbịa pụrụiche," dịka Charly Boy kwuru.

Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho

Akụkọ ndị ga-amasị gị: