Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
CJay Chijioke Nwokafor : Ihe ndị ị kwesịrị ị ma maka onye ihe ejije Nollywood a lara mmụọ
Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Chijioke Nwokafor a ma dịka 'CJay' alala mmụọ ka ọ gbachara afọ 46.
Ogbo ya bụ Nkechi Blessing Sunday, onye gbara ama a n' ozi o wepụtara n'akara ya n'ọbaozi Instagram ụbọchị Wenezde, kwuru na CJay nwụrụ n'ụlọọgwụ a kpóghí aha ya dị na Badore, Lagos, ụbọchị Wenezde.
Mana o kwughị ihe na-arịa CJay tupu ọ laa mmụọ.
Sunday ji anyammiri kwuo sị, " Ugbua anọ m n'ụlọọgwụ dị na Badore(Lagos). CJay efunahụla m. CJay anwụọla."
Ọ gara n'ihu kwuo na ya agaghị ewepụtakwa ihe onyonyo ọ kwadoburu iwepụta na mgbede Wenezde n'ihi ọnwụ CJay.
Sunday hiweburu emume mwepụtara n' ọha ihe nkiri a kpọrọ "Egwusi na Ọgbono" nke CJAy so na ndị ejije mere ya na mgbede Wenezde,abalị 30 nke ọnwa Septemba,afọ 2026.
N'otu n'ime ozi O wepụtara n'ikpeazụ na akara Instagram ya, CJay kwuru sị, "Ndụ dị nkenke nke ọ dịghị imefu na enweghị aṅụrị. Bie nkeji ọbụla ka ọ bụ ya bụ nke ikpeazụ gị."
Ndị Nollywood na-atụ arịrị ọnwụ ya
Ọtụtụ ndị ogbo Cjay na Nollywood nọ n'iru ụjụ.
Otu onye na-emepụta ihe ejije a ma ama bụ Ruth Kadiri bụ onye ya na Cjay rụkọrọla ọrụ kwuru sị, " Ọ bụrụ na a gbara m afa na ụbọchị m ga-ebi n'ụlọọgwụ, agahi m ekwe. Laa n'udo, CJay."
Onye ejije ọzọ a ma ama bụ Faithia Williams kpere ekpere ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa.
Emeka Nwagbaraọcha kwuru na ya "Ekwetaghị m na CJ anwụọla. Mụ na ya ziritara ozi n'ekwentị abalị ole na ole gara aga."
Onye bụdị CJay?
- Cjay bụ onye ejije Nollywood na-arịlite elu ma bụrụkwa onye e ji ihu ya ere ahịa.
- Onye Awka ,Anambra steeti, a mụrụ ya n'afọ 1980.
- Ihe nkiri o sonyerela gụnyere;"Godly Escort", "Larry Cold", 'The Private Tutor', "Coconut Head', "Housekeeper" "Bamikale", "Fond of You"wdgz..