Etu ndị ji egbe siri gbuo ndị uweojii na ndị nkịtị n'Enugwu na mgbede Wenezde

Ebe awakporo ndị uweojii
Mgbe e biputara ya

Egwu dị n'obodo Obeagu Uno, Ọkụnanọ nke dị n'Enugwu Steeti ebe ndị oji egbe wakporo ma gbuo ndị uweojii n'elekere 6:45 nke abalị n'ụbọchị Wenezde.

Otu onye hụrụ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ndị a bu ụgbọala Hilux ọcha, mgbe ndị uweojii na-akwụsị ha, na ha kuturu ma rịa otu onye uweojii elu.

Mgbe nke a mere ka ha na ndị uweojii bidoro gbarịtawa mgbọ.

Onye a kọwara na ndị a ji ihe kpuchie ihu ha niile.

Ụgbọala ndị uweojii

O kwuru na ihe ruru ndị uweojii asaa maọbụ isii nwụrụ na ya bụ mkpamkpa.

O gwara BBC Igbo na mgbọ tụkwara nwunye ya dịka ndị mmadụ nọ ebe ahụ gbara ọsọ gbaba n'ime ọhịa.

Onye a kwuru na ndị oji egbe a jụrụ sị, " kedụ ebe ndị uweojii nọ, na ha pụta ma ọ bụrụ na obi kara ha?".

O kwuru na ndị a mechara were mmanụ ụgbọala mụnye ụgbọala ndị uweojii ọkụ.

Dịka o siri dị, onye ntaakụkọ anyị ruru ebe ahụ chọpụtara na ndị uweojii abịala buru ozu ndị nke ha.

O kwukwara na ndị a mechara buru ụgbọala ha gawa Amagunze.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe n'ekwe ntị ya, o zitere ozi were sị na ọ bụ eziokwu na awakporo ndị uweojii na Ogeagu-Amechi na Agunzu nke dị na mpaghara okpuruọchịchị Nkanu.

O kwuru na ha ebidola nyocha ha ma sị na ha ga-ekwuputa mpụtara nyocha ha mgbe ha mechara.