Alex Ekubo na Fancy Acholonu agbasaala n'ezie

Ebe foto si, Alex Ekubo
Onye na-egosiputa akwa Fancy Acholonu na Alexx Ekubo bụ omeiheonyonyo nke Nollywood agbakeela n'ezie.
Cheta na ha abụọ kwụsịrị i so onwe ha n'igwe soshal midia dịka ọ pụtara ihe n'ụbọchị Wenzde.
Ha abụọ wepụkwara akara Instagram ha jikọrọ ọnụ mepee.
Fancy gbara nkewa ha n'anwụ n'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya n'ụbọchị Tọzde.

Ebe foto si, Fancy Acholonu/Instagram
Nke a na-abịa naanị onwe ole na ole tupu agbamakwụkwọ ha nke a na-ele anya na ọ ga-abụ n' abalị 20 nke ọnwa Novemba, afọ 2021.
O nweghị onye ma ma o nwere okwu na-esere mmadụ abụọ ahụ dịka Alex azaghị ekwentị ya oge BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwentị nke ọ na-asa ozi anyị zigara ya.
O wuru ewu na soshal midia ọnwa ole na ole gaara aga oge Alex Ekubo mara ọkwa na ya enweela onye ya na ya kwere onwe ha nkwa alụmdinanwunye.

Ebe foto si, Alex Ekubo
Naanị izu ole na-ole gara aga, mmadụ abụọ ahụ bụ ahụghị-ma- erighị dịka ha abụọ na-egosịrịta onwe ha ịhụnanya na soshal midia.
Iji maa atụ, izuụka atọ gara aga oge Alex tinyere foto were na-adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha gbaara akụkọ ọjọọ ọsọ, na ọ na-emebi ahịa, Fancy Achọlọnụ bere ebe ahụ dee n'asụsụ French sị, "Ị maka,ọ dị m ka m susu gị ọnụ ugbua".

Ebe foto si, Fancy Acholonu/Instagram
Ọzọ, na nso nso a, o wepụtara ihe onyonyo ebe ọ na-agba egwu n'emume ncheta ọmụmụ ya ma kwuo yna ya na nwoke ọzọ agaghị agba ekwu n'ihi na ya alụọla di.
Onye bụ onye?

Ebe foto si, Alex Ekubo/Instagram
Alex Ekubo
Alex Ekubo Okwaraeke bụ onye ihe ejije Nollywood a na-anụ aha ya.
Ọ bụ onye e ji ahụ ya ere ahịa nke Bekee kpọrọ 'model' ma bụrụkwa onye gbara onye nke abụọ n'asompi nwoke Naijiria kacha mma nke a kpọrọ "Mr Nigeria"
Onye Arochukwu dị n'Abia steeti, mana a mụrụ ya na Legọs.
Ihe ejije ndị o merela gụnyere: Lagos Cougars,Tinsel,Ladies Men wdg
Fancy Acholonu

Ebe foto si, Fancy Acholonu/Instagram
Fancy Chigozie Acholonu bụ nwa ada Igbo a mụrụ n'Amerịka
Ọ gụrụ 'Business Administration' na mahadum
Ọ bụ onye na-eme ihe ejije, ojiegoachụego nakwa onye e ji ahụ ya ere ngwaahịa.





























