Agbahapụrụ m mahadum maka iti egwu - Ruffcoin Nwaba

Aha onyonyo, Agbahapụrụ m mahadum maka iti egwu - Ruffcoin Nwaba
Agbahapụrụ m mahadum maka iti egwu - Ruffcoin Nwaba
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

Ruffcoin Nwaba akọwaala etu o siri gbahapụ agụmakwụkwọ mahadum maka iti egwu.

O kpughere nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche gbasara njem ya dịka onye na-eti egwu.

Ruffcoin Nwaba, onye ezigbo aha ya bụ Muruako Fortune Emenogu kọwara na ya na-amụ ihe gbasara iwu na mahadum tupu egwu akpọrọ ya.

"Ndị mmadụ amaghị, mana ọ bụ ọmụmụ iwu ka m na-agụbu na mahadum. Ihe mere m jiri hapụ ọmụmụ iwu na mahadum bụ maka na obi m anọchaghị na ya".

"Ọ na-abụ e nye m ego maka ịkwụ ụgwọ ebe obibi nakwa ihe ndị ọzọ, m were ya zụrụ oge n'ụlọ ebe a na-etipụta egwu, ka Ruffcoin kwuru."

Ruffcoin Nwaba kwukwara okwu gbasara okwu ọjọọ ọ sị Speed Darlington gwara ya, nke mere o jiri tipụtara ya egwu n'ime otu mkpụrụ ụbọchị.

"Ana m ahụ akụkọ mụ na Speed Darlington n'ịntaneetị. Amaghị m onye ọ bụ na mmadụ tupu oge ahụ. Abịara m hụ ebe Speed Darlington kwuru na a naghịzi anụ olu Ruffcoin, o wee m iwe".

"Ihe nkiri m na-eme bụ egwu, amaghị m etu e si agba ara na soshal midịa. Ahụrụ m ihe ahụ o kwuru mana tupu chi ejie n'ụbọchị ahụ, m wepụta egwu ọhụrụ".

"Ihe m kpọrọ egwu ahụ bụ "God Did", na mmalite ya ka m tinyere ebe ahụ o kwuru na a naghịzi anụ olu Ruffcoin ọzọ. Ihe ahụ were ya iwe. Ọ gwara m okwu ọjọọ, m wepụtara ya egwu n'ime otu mkpụrụ ụbọchị," ka Ruffcoin kọwara.

Ruffcoin bụ nwaafọ obodo Owahiafo dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Obingwa n'Abịa Steeti.

Egwu ya a kpọrọ 'Nwa Aba' wuru ewu oge ọ pụtara, bụ nke mere e ji mara nwaokoroọbịa ahụ ebe niile.

Ruffcoin kwuru na ya ekwetaghị na ndị Igbo na-eti egwu anaghị enyere ndị nke na-etolite etolite aka, n'ihi na ya onwe ya na-agbalị ịkwalite ha.