Etu m si zaa aha Corporal Nwafor n'oge agha Bịafra - Ugwumba Sasa Nwoke
Ugwumba Sasa Nwoke zara aha Corporal Nwafor n'oge agha Bịafra.
Ọ zaghị ezigbo aha ya maka na o jiri ya kpuche onye ọ bụ, ka a ghara igbu ya.
O kwuru nke a dịka BBC wepụtara onyoonyo kọwara ihe kpatara agha a Naịjirịa lụrụ ịhụ na Bịafra ekewapụghị onwe ya, maka idi n'otu.
Lee onyonyo a ma leekwa ihe ndị o kwuru maka agha.
Ọ sị, "Agaghị m echefu nọmba e nyere m n’oge agha Bịafra PA61832. Ụbọchị 28 Jenụwarị 1968."
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara Bịafra i kwesịrị ikiri
Ọ gara n'ihu sị, "Ihe anyị mere bụ ichekwa ala anyị. Kọpral Nwafor bụ mmadụ atọ dị n’ime otu onye. Kọpral Nwafor nke mbụ bụ nwaokoroọbịa ahụ bu ụgbọala anti-tank gun bazooka na-eji 73mm atụ ogbunigwe.
O wee tinyekwa na "Oge ndị Naịjirịa si Ọnịcha abata n’Ogidi, ụmụaka nwoke agbawa ọsọ. Kọpral Nwafor abata, ebe o ji anti-tank bomb. Sọ otu ogbunigwe ka o nwere, oge ọ batara n’ọgbọ ogbugbu, ya agba egbe ya. Po!"
"Ya agbarie ụgbọala na-awụ mgbọ agbarie. Ndị ntoroọbịa anyị anachịata. Ha meriri nkwakọrịta egbe ahụ. Ha eburu ụgbọala ahụ na-awụ mgbọ buga ya n’Umudike, Umuahịa, n’ụlọọrụ Research and Production, Biafra. Izu abụọ ka e ji kuziere anyị ịlụ agha, osisi ka e ji kuziere anyị."
"Ụdị ọzụzụ a ka e ji ọnwa isii maọbụ afọ abụọ akuzi ndị mmadụ. Ndị ọcha na-akpọ simulation. A sị gị tụgharịa na yaadị narị isii gaa ogo iri na ise n’ọwụwa anyanwụ, gị eji ọgụgụ isii chere ihu n’ọwụwa anyanwụ, chọwa ogogo digrii."
"Tupu i gawa n’agha, gị agwa onwe gị na ọ bụrụ ọnwụ gị anwụọ, ị lọtakwanu, nsogbu adịghị. Ị ma na e nwereike igbu gị." Na ngwụcha, o nyere ndụmọdụ sị, "Onye ọbụla kpachakwa anya, agha adịghị mma."



