Eji m 'First Class' pụta na mahadum mana ọ bụ ihe nkiri na-enyeju m afọ - Kingsley Omeokwe

Aha onyonyo, Eji m 'First Class' pụta na mahadum mana ọ bụ ihe nkiri na-enyeju m afọ - Kingsley Omeokwe
Eji m 'First Class' pụta na mahadum mana ọ bụ ihe nkiri na-enyeju m afọ - Kingsley Omeokwe
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Kingsley Chibuike Omeokwe bụ nwaafọ Ụmụduruihejiakụ Ugbelle dị n'okpuru ọchịchị Ideatọ Saụt n'Imo Steeti mana o toro n'Ọnịcha.

Nwaokoroọbịa ahụ gụrụ ihe ọmụmụ Asụsụ Bekee na mahadum University of Port Harcourt ma bụrụkwa onye a ma ama na-eme ihe nkiri na-akpa ọchị.

Oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Kingsley Omeokwe kọwara na ya ji akara nzere 'First Class' pụta na mahadum mana ọ bụ ihe nkiri ọ na-eme na-enyeju ya afọ.

Dịka o siri kwuo, ihe kpaliri mmụọ ya ime ihe ngosi bụ iji gosipụta ụfọdụ ihe ndị na-eme n'ezinaụlọ, nke ọtụtụ mmadụ nwereike ịghọta.

"Oge m malitere ime ihe nkiri, ebumnobi m bụ ime ihe onye niile nwereike ịghọta, nke ọ ga-abụ onye hụ ya, o kweta na ọ na-eme. Ezinaụlọ m abụghị ebe kachasị nwee ọgbaaghara. Enwere m ụmụnne ndị nke nwoke anọ. Naanị ụmụnwoke ka anyị nwere mana mụ onwe m bụ nwa nke ikpeazụ. Ka Chukwu gọzie mkpụrụobi nne m. Nne m bụ nwaanyị na-egosipụta akparamagwa dị iche iche, mana ọ bụ onye nwere ezigbo obi ọma. Anyị bụ ezinaụlọ ji obiọma tolite, mana ụfọdụ ihe mekwara."

Kingsley Chibuike Omeokwe kpughere na ihe mere ihe nkiri ya jiri pụọ iche bụ maka na ọ na-ewebata amamihe sitere n'ihe ndị ọ gụrụ na mahadum n'ihe nkiri ndị ọ na-eme.

"O nwere ihe nkiri m mere gbasara achịcha. Eji m ihe gbasara mmekọrịta mee ka onye na-achọ ịgbanwe ọnọdụ ahụike ya, dịka mgbe mmadụ chọrọ ịgbanwe nri maka ahụike. Emere m ya ọ dị ka mgbe mmadụ na-alụ ọgụ ka ọ laghachi na nke enyi ya nwaanyị ochie. Ihe m gụrụ na mahadum mere ka m mụta ụfọdụ atụmatụokwu, mbụrụ na ihe ndị ọzọ," ka ọ kọwara.

Omeokwe kọwakwara na o nweela ụfọdụ ọnọdụ ndị ọ hụtara onwe ya mere ka ọ dị ya ka ihe ọ na-eme abụghị ihe o kwesịrị ime.

"Etu a ezinaụlọ m dị, ha ma na m ji 'First Class' pụta, m sị ha na ihe m chọrọ ime bụ ihe ngosi, iji na-akpa ndị mmadụ ọchị. Oge m bidoro, amaara m na m ga-ebu ụzọ gosi onwe m iji mee ka ha mara na ihe a dịkwa mma. Eji m ego m malite, mee ya ọnwa nke mbụ na nke abụọ, m jụọ onwe m ma ihe a m na-eme ụzọ ọ nọkwa na ya, ka ọ bụ m hapụ ya chọrọ ihe ga na-enye m ego kwa ụbọchị," ka Kingsley Omeokwe kwuru.

Ka ọ dị, o sịrị na ihe gbara ya ume bụ na ya maara ebe ọ na-aga "maka na ị mara na ebe ị na-aga, na ụzọ dị ya, ị ga-aga n'ihu na-aga."