"Anyị nwuchiela ndị uweojii ise aka ha dị n'ọgbaaghara mere n'Ọnịcha Head Bridge" Ndị uweojii

Aha onyonyo, Ka ọgbaaghara si bido n'Ọnịcha Head Bridge
"Anyị nwuchiela ndị uweojii ise aka ha dị n'ọgbaaghara mere n'Ọnịcha Head Bridge" Ndị uweojii
    • Onye dere ya, Michael Ilediagu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC na ha achọpụtala ma jide ndị uweojii ahụ aka ha dị n'ọgbaaghara ahụ dịka gbara mmadụ egbe n'Onicha Headbridge Anambara.

Tochukwu Ikenga kwuru na ha bụ ndị uweojii ise aka ha dị n'ọgbaaghara ahụ dịka nnyocha banyere ihe mere n'aga n'ihu.

Cheta na nsogbu ahụ dapụtara mgbe ndị uweojii gbara otu nwoke egbe n'ụkwụ.

Otu onye na mmadụ atọ mgbọ egbe tụrụ mgbe ndị uweojii ahụ na-agba ọsọ ndụ ha gwara BBC na ya bụ onye na-ebunye ibu n'ime ụgbọala hụrụ ebe mmadụ abụọ na-achọ ịlụ ọgụ, mana ka ya jụrụ ha

Onye ntaakụkọ BBC gaghachiri azụ n'ebe ahụ ọgbaaghara tiwapụrụ kwuru na udo alọghachitala n'ebe ahụ dịka ndị ahịa mepere ụlọahịa ha n'Ọgbọọgwụ Onịcha.

Ka ọgbaaghara si bido n'Ọnịcha Head Bridge

Cheta na ngaghrịiwe tiwapụrụ n'Ọnịcha Head Bridge dị n'Anambra steeti ka akụkọ kwuru na ndị uweoji gbara otu nwoke egbe ma gbalaga maka na o ekweghị ka ha kpụrụ ya.

Igwe mmadụ ji iwe mechie okporoụzọ ahụ ma bido ngagharịiwe. Nke a metụtara njem na azụmahịa na mpaghara ahụ bụ ebe ahịa Ọgbọ-Ọgwụ nọ.

Otu nwoke hụrụ oge ihe mere gwara ụlọmgbasaozi BBC News Igbo ihe ọ hụrụ na etu e si meruo ya ahụ

N'aka nke ọzọ, kọmịshịọna ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Nnanna Oji Ama gara zute ndị na-eme ngagharịiwe ahụ ma kwee nkwa ime nnyocha banyere ihe mere.

Oji Ama kwuru na ha ga-achọpụta ihe mere n'etiti ndị uweojii ahụ nakwa nwoke ha gbara egbe.

Mgbe akụkọ a na-apụta onye a gbara egbe ka nọ n'ụlọọgwụ na-anara ọgwugwọ.