Trump chọrọ iwepụ South Africa na Rwanda na nkwekorịta azụmahia ha na America

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Allan Olingo
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Onyeisiala America bụ Donald Trump enyela ndị ụlọomeiwu ebumnnobi ya iwepụ South Africa na Rwanda n'atụmatụ azụmaahịa malite n'abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2027.
Atụmatụ azụmaahịa 'African Growth and Opportunity Act (Agoa)' na-enye ohere ka mba ụfọdụ dị n'Africa tozuru nwee ikike ibupụ ọtụtụ ihe ha na-emepụta gaa n'America na-akwụghị ụgwọ isi.
Onye nnochiteanya azụmaahịa nke mba America bụ Jamieson Greer kwuru na ozi o wepụtara na a chọpụtara na mba abụọ ahụ na-eme ihe megidere iwu ntozu maka nwekọrịta azụmaahịa ahụ.
Greer kwukwara na ọchịchị Trump ezigarala mba abụọ ahụ ozi maka nke ahụ.
Ọchịchị Trump kwuru na nke a bụ maka mgbochi ha tinyere nye ahịa America nakwa okwu metụtara nchekwa na ọdịmma Amerịca na mpaghara ahụ.
Na nke mba Rwanda, Washington kwulitekwara banyere ikike dịịrị onye, ohere inwe otụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị, ikike dị n'iwu nakwa ikike ndị ọrụ.
Nke a na-abịa ka ọ gachara otu izuụka America nyechara Ministrị na-ahụ maka nchekwa nke mba Rwanda mmachi maka ebubo ịkwado ndhịagha nnupụisi na mba DR Congo.
Ụlọọrụ 'US Treasury' kwuru na Ministry nchekwa Rwanda nyere ndịagha ha iwu ịkwado ndị agha nnupụisi M23 dị n'Ọwụwa-Anyanwụ DR Congo, site na inye ha ngwaagha, akọrọkwa nakwa ọzụzụ.
Dịka O siri metụta South Africa, America na-ebo ebubo nrụrụaka.
Greer kwuru sị, "Ọchịchị Trump na-agba mbọ ịghụ na mba ndị Africa anyị na-aha na-arụkọ gbara mbọ ime ihe ha ga-eji etozu."
Minista na-ahụ maka Azụmaahịa nke mba South Africa bụ Parks Tau kpọro ya 'ihe mwute", ma sị na Washington na-akpalite ihe ọhụrụ na-adịbughị na nkwekọrịta azụmaahịa mba abụọ ahụ nke malitere n'afọ 2025.
Tau kwuru sị, "Anyị ga-aga n'ihu ime ngwa ngwa ịgbasa mba ndị South Africa na-ebuga ahịa iji chekwa ọrụ."
Onye nnọchiteanya Amerca na mba South Africa bụ Leo Brent Bozell III kwuru na ọ bụ ihe mwute na Atụmatụ South Africa mere ihe e jikachapụ aka ha na mba ndị sonyere n'Agoa.
O kwuru n'akara X ya sị, " Nke a bụ ihe a ma na ọ ga-eme ma bụrụkwa ihe a gaara egbochinwu dịka South Africa jụrụ ịnabata ihe ndị America na-atụ uche maka ya.
Ọkwa a amara na-abịa dịka mmekọrịta mba Amerịca na mba abụọ ahụ bụ South Africa na Rwanda kpụrụ afọ n'ala.
N'afọ 2025, Trump boro South Africa ebubo mkpagbu ndị ọcha oge ya na Onyeisiala Cyril Ramaphosa zutere n'obi Gọọmentị 'White House' ma mepere ndịọcha ndị South Africa (Africaners) ụzọ ịgbata ọsọndụ n'America.






























