Mkpa ọ dị ịgbanyụ ekwentị oge ụgbọelu na-efepụ maọbụ na-efedata - Captain Callistus
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Ọkwọụgbọelu a ma ama bụ Kenechukwu Callistus agwala ndị ji ụgbọelu eme njem ka ha gbaa mbọ na-erubeisi na ntụziaka a na-enye ha ka ha gbanyụọ ekwentị ha oge ụgbọelu na-efepụ maọbụ mgbe ọ na-efedata.
Kenechukwu Callistus a maara nke ọma dịka Captain Callistus nyere ndụmọdụ a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche iji mara gbasara ụfọdụ ihe ndị na-emegasị na ngalaba njem ụgbọelu.
Captain Callistus sịrị: "Ihe mere e ji enye ndụmọdụ a abụghị maka ihe ọzọ karịa nchekwa, n'ihi na oge ọbụla ụgbọelu na-efe, ọ bụ ugbua ka ọ bịara dịka teknụzụ ọ na-abawanye. Oge mbụ, o nwere ọdọụgbọelu ụfọdụ ọ na-abụ anyị na-efebanye maọbụ na-efepụ, anyị a na-anụ ụda ndị a na-esi na redio apụta na-ada shhhhh".
"Ihe na-ebute ihe a bụ mmakọ ikuku ozi ọzọ, o nwereike ọ bụrụ na ikuku ozi si n'ala maọbụ nke si n'ekwentị na-amanye n'ikuku ozi nke ụgbọelu. Oge ahụ ga-eme ka...otu ntabianya pụtara otu afọ na ngalaba njem ụgbọelu".
"Ọ bụrụ na e nwereike inwe ihe dịka nzirịtaozi n'oge ahụ, mmakọ ahụ nwereike gbochie ihe ọkwọụgbọelu na-agwa ndị nọ n'ala maọbụ ihe ndị nọ n'ala na-agwa ọkwọụgbọelu. Ọ bụ ndụmọdụ dị mfe, nke ọ ga-abụ, ọ bụrụ na onye niile rubeisi na ya, o nweghị ihe ọbụla siri ike dị na ya."
Captain Callistus kwukwara okwu gbasara ajọ ikuku a kpọrọ 'turbulence' bụ nke na-amanyekarị ndị njem obi n'afọ oge ha nọ n'elu.
Ọtụtụ mmadụ ekwuola na ajọ ikuku ahụ nwereike ime ka ụgbọelu kpọkaa, mana oge anyị jụrụ Captain Callistus, o kwuru na etu okporoụzọ ọjọọ si eme ka ụgbọala dagharịa bụkwa etu ajọ ikuku si emetụta ụgbọelu.
"Hụta ajọ ikuku bụ 'turbulence' dịka ọkwọụgbọala na-akwọ ụgbọala. Ọ bụrụ na anyị na-akwọ ụgbọala maọbụ anyị banye n'ime ụgbọala, maọbụ na keke maọbụ n'ime ihe ọbụla na-agba n'okporoụzọ, ụfọdụ okporoụzọ adịchaghị larịị etu ụgbọala ahụ ga-esi gbaa nke ọma ka onye niile nọ n'ime ya rahụ ụra na-enweghị ka ụgbọala siri dagharịa"
"Etu ahụ ka ọ dịkwa n'ụgbọelu. Olee ụzọ ụgbọelu na-agba? Ọ bụ n'ikuku. Ikuku ahụ dị larịị, ụgbọelu a na-efere onwe ya na-enweghị nsogbu ọbụla. Mana ọ bụrụ na e nwee nnukwu ọmajijiji n'ikuku, gịnị ga-eme ya? O bido dagharịwa. Ọ bụ ya ka a na-akpọ 'turbulence'".
"Mana anyị onwe anyị na-akwọ ụgbọelu, anyị na-ahụ ụfọdụ n'ime ha, n'ihu ngwaọrụ anyị ji akwọ ụgbọelu. Ọ bụrụ na o gosi, anyị atụlee ya, iji mara nke dị nnukwu na nke dị obere. Anyị na-ezere ndị nke nnukwu, site n'ebe ha dị obere maọbụ ebe ha na-adịghị adị gbafee, ka njem dịrị onye niile larịị, ka mmapụ obi na ịsụ n'ire ghara ịdị nnukwu," ka Captain Callistus kwuru.
Ọ gakwara n'ihu sị "Ma ajọ ikuku ọ na-eme ka ụgbọelu kpọkaa? Mba. Ama m na ọ na-ebute nnukwu obi mmapụ, mana nke ahụ bụ etu ahụ mmadụ si egosi mmetụta. Obi mapụchaa, ọ lọghachite. O nweghị ihe na-eme. O nwere ndị nọ ebe ahụ na-ahazi ihe niile etu e siri chọọ."



