Alex Ekubo: Ihe a gaghị eji chezọọ onye ihe ejije 'Nollywood' a a ma ama
Ọnwụ onye na-eme ihe nkiri a ma ama, bụ Alexx Ekubo ka na-akpalite oke mwute, na uru ụjụ n’obi otụtụ ụmụ Naijiria na ụwa.
Alex Ekubo nwụchuru dịka ọ dị naanị afọ iri anọ, n'abalị 11 nke ọnwa Mee, afọ 2026 sịte n’ọrịa kansa akiri , dịka ezinaụlọ ya si kwuo.
Ọnwụ ya butere mgbawa obi na ihe anya mmiri nye nde kwuru nde ndị ihe ya na-amasị na ndị na-eso ya.
Ma lee ihe a gaghí eji echefu ya:
A mụrụ Alex Ikenna Ekubo bụ nwa nke abụọ n’ime ụmụ anọ n’ezinaụlọ Mazi Alex na Oriakụ Jane Ekubo-Okwaraeke ndị Arọchukwu, Abia steeti n’ abalị iri nke ọnwa Eprelụ afọ 1986.
Ọ gara kọleji na ‘Federal Government College dị na Daura, Katsina Steeti, gụkwa maka Iwu na Mahadum ‘University of Calabar’.
Na-agbanyeghị na ọ gụrụ iwu, ọchịchọ obi ya dọtara ya gaa n’ ime ihe nkiri na iji ihu ya ere ahịa.
Aha Alex pụtara ife nke ọma mgbe ọ ghọrọ onye nke abụọ n’asọmpi Mr Nigeria n’afọ 2010.
Site n’ebe ahụ, ụzọ meghere ya na Nollywood.
Ọ pụtara n’ọtụtụ ihe ejije dịka ‘Weekend Getaway’, ‘In The Cupboard’, Bling Lagosians, na A Sunday Affair.’ Na Ahamefuna
Ọtụtụ ndị maara Alex Ekubo dịka nwoke mara mma, nwere akara aka n’ime ejije, onye na-eme ka ndị mmadụ chịa ọchị, ma bụrụkwa onye egighị ezinaụlọ egwu egwu.
N’ime ọtụtụ afọ ya na Nollywood, ọ ghọrọ otu n’ime ndị kacha ewu ewu n’Afrika.
Ekubo e mela n'ihe karịrị ihe nkiri otu nari.
Nweta ọtụtụ nturuugo n’ọrụ ya.
Ụfọdụ n'ime ha gụnyere: Onye Nkwado Pụrụ Iche na Ihe Nkiri (Best Supporting Actor) n'afọ 2012, maka ọrụ ya n'ihe nkiric, ‘Weekend Getaway’.
Onye Ihe Nkiri Kasị amasị Ndị Mmadụ (Most Popular Actor) n'afọ 2021, na ndị ọzọ.
Alexx Ekubo malitere izere soshal midi
Ozi ikpeazụ ọ bipụtara na Instagram bụ n'ụbọchị iri atọ n'ọnwa Disemba afọ 2024.
Ọtụtụ ndị mmadụ enweghị nghọta banyere ihe ọ na-agabiga.
Mgbe akụkọ ọnwụ ya pụtara, akụkọ bidoro ikwu na ọ nọ na-alụ ọgụ megide ọrịa kansa tupu ọnwụ ya.
Ọtụtụ ndị omee Nollywood tinyere ndị egwu kesara ozi mwute.
Ụfọdụ kwuru na Alexx bụ:“Onye nwere obiọma na nka pụrụ iche…”
Na-agbanyeghị na ndụ ya kwụsịrị na-erughí eru, ihu ọchị ya, obiọma ya na ọrụ Alexx Ekubo hapụrụ agaghị efu ọsọ ọsọ.



