Lee aha ndịagha niile nwụrụ n'ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkasịrị n'Igbokoda Ondo State

Ebe foto si, Nigeria airforce
Ndịagha ụgbọelu Nigeria bụ Nigeria Airforce ewepụtala aha ndị otu ha niile nwụrụ n'ụgbọelu ha kpọkasịrị n'obodo Igbokoda nke Onodo State n'ụbọchị Sọnde 04 Ọktoba 2026.
Nke a dị n'ozi onyeisi mgbasaozi ndịagha ụgbọelu bụ Ehimen Ejodame wepụtara n'ụbọchị Tuzde 6 Ọktoba 2026.
Ozi ahụ kwuru na ụgbọelu a nke akara ya bụ NAF 931 bu mmadụ iri abụọ na ise nke gụnyere ndị ọrụ ụgbọelu mmadụ ise na ndịagha ndị ọzọ mmadụ iri abụọ si Benin na-aga Lagos mgbe ọ kpọkasịrị.
Lee aha mmadụ iri abụọ na ise ahụ

Ebe foto si, NAF
Aha ndị a gụnyere;
Ndị ọrụ ụgbọelu:
1. Squadron Leader MI Aburime (Flight Captain)
2. Squadron Leader AP Man-Ugwueje (Co-pilot)
3. Flight Lieutenant IS Bako (Co-pilot)
4. Warrant Officer Abubakar A (Aircraft Technician)
5. Corporal Uguru HC (Aircraft Technician)
Ndị e bu n'ụgbọelu ahụ
6. Flight Lieutenant TL Lazarus
7. Flight Lieutenant M Akinloye
8. Flying Officer IM Adeshina
9. Master Warrant Officer Onwuka F
10. Master Warrant Officer Matini BA
11. Warrant Officer Nuhu FS
12. Flight Sergeant James RB
13. Flight Sergeant Mohammed AI
14. Sergeant Ani AE
15. Sergeant Izibenikien SI
16. Sergeant Alafuka C
17. Sergeant Mbadugha AN
18. Lance Corporal Ugwuba FC
19. Lance Corporal Eledan GE
20. Mrs Ezeh Nneka
21. Godstmine Tarabina
22. Joy Micheal
23. Sunday Micheal
24. Ukeme David
25. Gideon Omotola
Ejodame kwuru na a ka na-achọ ụfọdụ ndịagha so n'ụgbọelu ahụ achọ site n'enyemaka ndị ọrụ ọzụ nakwa ndị obodo.
Ka ọ dị ugbua, o nwebeghi onye a hụrụ fọrọ ndụ.

Ebe foto si, NAF
Onyeisi ndịagha ụgbọelu bụ Ọchịagha Sunday Kelvin Aneke gosiri obi mwute ya ma zigaara ezinaụlọ ndị a ozi itiaka n'obi.
Ọ kọwara ihe mberede a dịka ihe mgbawaobi nye ndịagha ugbọelu Nigeria nakwa Nigeria n'uju ma kwee nkwa na a ga-enyere ezinaụlọ ndị a nkwado n'oge ihe iru uju a.
Ọ gara n'ihu kwuo na o nyela iwu ka a malite ime nnyocha etu ihe mberede a si mee nakwa ihe kpatara ya.
Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu gosikwara mwute ya, tie ezinaụlọ ndịagha a aka n'obi ma tinye ụbọchị atọ maka iji rue uju n'ọnwụ ha.
Cheta na nke a abụghị mbụ ụgbọelu bu ndịagha Nigeria na-akpọkasị na nso nso a, e nweela akụkọ ugboro ole ma ole o merela n'ime afọ na-adịchaghị anya.






























