Gịnị dị n'iwu ọhụrụ ụka Jehovah's Witnesses mere gbasara ịnara ọbara?

Foto gosiri ọbara mmadụ e nwereike itinyere onye ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ụka àmà Jehova ekwuola na mkpebi gbasara ịnara ọbara maka ọgwụgwọ ọrịa dịzi n'aka onye otu ha ọbụla, dịka akọ na uche onye ahụ siri kwe ya.

Mana ha kwuru na mgbanwe a apụtaghị na ha amalitela ikwe ka ndị otu ha nara ọbara zuru ezu n'aka onye ọzọ.

Mgbanwe a na-enye ndị otu ha ohere ịnara ụfọdụ akụkụ ọbara, maọbụ iji ọbara nke ha rụọ ọrụ n'oge ọgwụgwọ ahụike.

Kedụ ihe iwu ọhụrụ a kwuru?

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị ụka àmà Jehova n'ụwa niile bụ Paul Gillies wepụtara n'izu gara aga, ka o kwuru na onye ọbụla so n'otu ahụ nwere ike ikpebi ma ọ ga-anabata ka amịnye ya ụfọdụ akụkụ ọbara n'oge ọgwụgwọ ma ọ gaghị.

Akụkụ ọbara ndị a gụnyere 'red blood cells', 'white blood cells', 'plasma' na 'platelets'.

N'otu aka ahụ, onye otu ha ọbula chọrọ ka amịpụta akụkụ ọbara ka e jiri nyere onye ọzọ aka nwekwara ike ikpebi nke ahụ n'onwe ya.

Ozi ha wepụtara kwuru sị: "Onye ọbụla so n'otu anyị ga-ekpebi n'onwe ya ma ọ ga-amịputa ọbara ka e jiri ya nyere onye ọzọ aka.

Gịnị ka iwu ụka Jehovah's Witnesses machiri?

Ndị ụka àmà Jehova kọwara na ha ka machibidoro mmịnye ọbara zuru ezu nke sitere n'aka onye ọzọ bụ nke pụtara na mgbanwe a apụtaghị na iwu ha gbasara ọbara agbanwela kpamkpam.

Ha ka na-ekwu na iji ọbara zuru ezu megidere nkụzi ha banyere ihe akwụkwọ nsọ bụ 'Bible' kwuru gbasara ọbara.

Ha rụturu aka n'akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi 15:20, nke kwuru ka Ndị Kraịst zere ọbara.

Paul Gillies kwuru na ọbara ka bụ ihe dị nsọ nye ndị àmà Jehova, ma kwuo na ha na-ele ndụ na ọbara anya dịka onyinye pụrụ iche sitere n'aka Chineke.

Cheta na ọ bụ n'ọnwa Maachị 2026 ka otu ahụ kọwara na onye ọ bụla so n'otu ha nwere ike iji akọ na uche ya kpebie ihe a ga-eme na ọbara ya n'oge ịwa ahụ maọbụ ọgwụgwọ.

Nke a nwere ike ịgụnye ikwe ka amịpụta ọbara ya, debe ya nwa oge, ma mechaa mịnye ya n'ahụ ya

Ha kwuru na ụfọdụ ndị àmà Jehova nwere ike ịnabata usoro a, ebe ndị ọzọ nwere ike ịjụ ya.

Gịnị mere ha ji eme mgbanwe ndị a?

Nkọwa ndị ụka Jehovah's Witnesses bụ na akwụkwọ nsọ bụ 'Bible' kwuru banyere ịzere ọbara, mana o kwughị kpọmkwem banyere ọtụtụ usoro ọgwụgwọ ọbara ọhụrụ metụtara akụkụ ọbara maọbụ iji ọbara mmadụ n'onwe ya mee ihe n'oge ọgwụgwọ ahụike.

N'ihi nke a, ha kwuru na ụfọdụ n'ime mkpebi ndị a bụ nke onye ọbụla ga-eji akọ na uche ya mezie ugbua.

Gillies kwuru na ọgbakọ ndị ámá Jehovah anaghị etinye aka na mkpebi akọ na uche onye ọbụla.

Ọ gbakwụnyere na ha nwere ekele maka ndị dọkịta nwere nka bụ ndị na-enye ndị otu ha ezigbo nlekọta ahụike ma na-asọpụrụ nkụzi ha gbasara ọbara.