Ihe i kwesiri ịma ma chekwa onwe gị maka akụkọ ụgha n’ịntaneti
Akụkọ abụghị eziokwu ebutela ọnwụ ọtụtụ mmadụ na ọgbaaghara n'obodo nakwa mba dị icheiche n'Afrịka.
Nsonso a egburu mmadụ karịrị iri asatọ maka ebubo ụgha nke akụkọ na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekesa n'ịntanet banyere izu ohi akụkọ ahụ ụmụnwoke ji akpụ nwa na mba dịka Tanzania, Zambia na Mozambique.
Mana dịka Naịjirịa na-achọ ime ntuliaka n'afọ 2027, BBC haziri ihe ọmụmụ nakwa ọgbakọ isiokwu ya bụ 'Disinformation Festival and Trust is Earned' n'olu bekee n'ogige Afe Babalola Hall, Mahadum Legọs.
Ndị isi ụlọọrụ BBC News bụ Fiona Crack nakwa onyeisi BBC News n'Afrịka bụ Juliet Njeri kọwara ọgbakọ ahụ dịka usoro iji kuziere ọhanaeze etu ha ga-esi amara okwu ụgha mgbe ọbụla ha hụrụ ya n'ịntanet.
Cheta na ịchụ nta vootu ga-abịa ma laa, mana ọtụtụ oge ihe akụkọ ụgha maọbụ okwu ụgha mebiri adịghị adị mmfe imezi ọzọ.



