Nsogbu nchekwa, Nnamdi Kanu na ihe ndị ọzọ Gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpara na nzukọ ha

Ebe foto si, Enugu state Government
Mgbe e biputara ya
Nzụkọ pụrụiche nke Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ nwere ụnyaahụ n'Enugwu ji ọtụtụ ihe mapụta.
Ihe ndị ha kpebiri gụnyere ị ga leta onyeisiala Tinubu iji kpa maka ihe ndị dị mkpa metụtara mpaghara ahụ ọ kachasị ihe metụtara akụnụba obodo nakwa nsogbu nchekwa.
Dika onyeisi ọgbakọ ahụ bụ Hope Uzodimma aka na-achị Imo steeti si kwụ, ọ kelere Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala ochie Naịjirịa nakwa Obi nke Ọnịcha bụ igwe Achebe maka nleta ọ bịara na nzụkọ ahụ.
Lee okwu ha n'uju ebe a:
- Ọgbakọ ahụ zigara steeti niile dị n'ọwụwa anyanwụ nakwa ezinaụlọ Ogbonnaya Onu ozi itiakanobi maka ọnwụ ya.
- Ha nabatara aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Nnaemeka Achebe nakwa Emeka Anyaoku bụ ndị bịara nleta na ya bụ ọgbakọ.
- Ha nyochara mpụtara nzukọ ha nwere gbasara ihighari akụnụba mpaghara ọwụwa anyanwụ ma kpebie ịmalite ọtụtụ ihe ndị ha kwekọrịtara maka ya.
- Ha kpebiri ịga leta Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ikpesara ya nsogbu ndị chere mpaghara ahụ aka mgba
- Ha kpebiri ileta Onyeisiala Naịjirịa kwa ịmalite mkparịtaụka maka ntọhapụ Nnamdi Kanu
























