Ụlọikpe na Lọndọn ekwuola na ikpe amaghị Diezani Alison-Madueke n'ebubo iri ngarị e boro ya

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe ekwuola na aka Diezani Alison-Madueke bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị dị ọcha n'ebubo mpụ ụlọọrụ e boro ya.
Ụlọikpe dị na Southwark Crown, Lọndọn na mba Briten kpebiri na aka Diezani Alison-Madueke bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị dị ọcha n'ebubo mpụ na nrụrụaka e ji kpụga ya n'ụlọikpe.
Cheta na EFCC bidoro kamgbe afọ 2013 na-enyocha Diezani Alison-Madueke. Mana na mba Briten ka e mechara kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo iri ngarị, mmefusi ego na ihe ndị ọzọ nke mere e ji jide ya.
Kamgbe ahụ, Diezani Alison-Madueke nọ na London dịka onye a na-enyonyo maọbụ onye nọ na nga.
Onye bụ Diezani Alison-Madueke?
Alison-Madueke dị afọ iri isii na ise. A mụrụ ya n'abalị isii nke ọnwa Disemba 1960 na Pọtakọt, Rịva Steeti.
N'afọ 2007 ka ọ bụ mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjirịa.
N'afọ 2008 ka ọ bụrụ mịnịsta na-ahụ maka ihe ngwupụta ọnatarachi dị n'ala.
N'afọ 2010 ka ọ bụrụ nwaanyị Naịjirịa nke mbụ bụ mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị. Ọ nọrọ n'ọkwa ahụ bido n'afọ 2010 ruo n'afọ 2015.
Ọ mechere bụrụ nwaanyị nke mbụ bụ onyeisi otu jịkọtara ọtụtụ mba dị icheiche na-ere mmanụ agbịdị a na-akpọ Organization of the Petroleum Exporting Countries (Opec).
A họpụtara ya dịka onyeisi Opec na Vienna, na Nọvemba 27, 2014.
Ebubo ise e boro ya na mkpebi ụlọikpe nyere

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ụlọikpe Southwark Crown na London kpebiri na aka Alison-Madueke dị ọcha n'ebubo ise e ji kpụta ya ụlọikpe ahụ.
Ebubo ndị ahụ gunyere ị nara aka azụ maọbụ iri ngarị nakwa iso kpaa nkata inye akaazụ.
Ebubo ọzọ bụ na o si n'azụ gaa nara ndị na-atụ mgbere ji ego achụnta ego akaazụ ruru nde pounds abụọ (ya bụ £2m).
Ụlọọrụ a sị na ọ naara ego ahụ nakwa ngwaahịa ya na ya so ka a sị na ọ bụ Harrods.
E bokwara ya ebubo iji nde pound anọ na isii (£4.6m) dozie ụlọ abụọ dị na Lọndọn nakwa Buckinghamshire.
Ndị ọzọ ụlọikpe sị n'aka ha dị ọcha banyere ikpe ahụ
Onye ọzọ ụlọikpe sị na aka ya dị ọcha bụ nwanne Alison-Madueke aha ya bụ Doye Agama dị afọ iri isii na itoolu.
Ụlọikpe sị na Agama adaghị iwu maọbụ mee nrụrụaka.
Cheta na Agama bụ 'Archbishop' n'ụlọụka Pentikosta dị na Mancherter.
Onye ọzọkwa ụlọikpe kpebiri ikpe ya bụ Olatimbo Ayinde na-azụ ahịa mmanụ.
Ayinde dị afọ iri ise na anọ. Ụlọikpe ahụ kwuru na aka ya dị ọcha banyere ebubo iri ngarị na mpụ ego e boro ya.




























