Ụzọ ise ị ga-esi belata awa ole nwatakịrị ji ekiri ihe onyoonyo

Aha onyonyo, Ụzọ ise i ga-esi beleta awa ole nwatakịrị ji ekiri ihe onyoonyo
Ụzọ ise ị ga-esi belata awa ole nwatakịrị ji ekiri ihe onyoonyo
Mgbe e biputara ya

Bịa, lee ụzọ ise i ga-eji beleta ya.

Ndị maara ihe ekwe na-akụ na ngalaba omume na ọzụzụ ụmụaka kọwara ụzọ nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka maka ntighara anya sitere n'ihe ha na-ekiri n'onyonyo maọbụ.

Dọkịta Jane Gilmor na-ahụ maka agwa ụmụaka kwuru sị, kama ịnapụ ụmụaka dị etua ekwentị n'ike, ihe mbụ ga-abụ iwere "charger" ekwentị ahụ.

Jane Gilmor sị ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka e kwesịrị iji napụta ha ekwentị, ma katọọ ime ya n'ike.

Onye ọzọ bụ Dọkịta Maryhan Baker kwuru sị, nne na nna nakwa nwatakịrị ha kwesịrị ikpa ya ka nkata ma ọ bụrụ na ụmụaka ahụ gbagotere n'afọ ole ha dị.

Mana Dọkịta Olivia Edward's kwuru na ọ ka mma na nne na nna tinyere anya n'ihe ụmụ ha na-ekiri ma ghọta ya.

Dọkịta Jane sị na ọ dị mma na nne na nna kụziere ụmụ ha usoro dị mma ha ga-eji echekwa onwe ha nakwa ihe ha kwesịrị ị na-eme n'Ịntanet maọbụ na-ekiri n'onyonyo.

Nchịkọta okwu ha niile bụ nne na nna ime ka ụmụ ha na-egwuriegwu ga-eme ka uche ha haraibane. na-etinyeghi anya n'Ịntanet maọbụ Onyonyo.