Etu m si malite ime kọntent maka ahịa forex - Emma Odiaa
Emmanuel Iheeshi Ohabuiro a maara dịka Emma Odiaa, bụ onye na-eme ihe ịkpaọchị nakwa nke bekee kpọrọ content nke ọ na-ekesa na soshal midia.
Amụrụ Emmanuel n'Abia steeti mana o tọrọ n'Onitsh, Anambra steeti.
O bidoro ime ihe ịkpaọchị bekee kpọrọ comedy oge ọ nọ Onitsha mana ọ hapụrụ ya gaa Benin maka na ọ naghị aga ọfụma.
Nwaamdị a gara n'ihu kọwaara anyị na o mechara gaa Benin ma rụọ ọtụtụ ọrụ dị iche iche mana nke ahụ agaghịkwa.
Ọ bụ nke a mere o ji bịa Legọs iji chọọ etu ọ ga-esi gbanwee ndụ ya.
N'okwu ya, "Oge m bịara Legọs, achọpụtara m na ndị na-eme ihe ịkpaọchi nọkwa ebe a. E nwere otu m sonyere ka ha kụziere m ka ha si eme ihe ịkpaọchi. Oge otu ahụ malitere ịda mbà, enwere m ekwentị oga anyị ji ekwentị ya eme vidio kwuo ụfọdụ ihe ma tinye ya n'Instagram nakwa TikTok".
Emmanuel kwuru na ọ maara ka e si mee forex mana ọ bụghị onye ọkachamara na ya.
O mere ka doo anya na njem ya dịka onye na-eme kọntent bụ jupụtara n'ọtụtụ ọwụwa mana o kpebiri na ya aghaghị ada mba na ya.



