Aka ndị uweojii akparala ndị na-ekesa mkpụrụmmiri na anwụrụike n’Anambra

Aha onyonyo, Aka ndị uweojii akparala ndị na-ekesa mkpụrụmmiri na anwụrụike n’Anambra
Aka ndị uweojii akparala ndị na-ekesa mkpụrụmmiri na anwụrụike n’Anambra
Mgbe e biputara ya

Kọmishọna ndị uweojii ọhụrụ nke Anambra steeti bụ Nnanna Oji Ama, amalitela ọrụ ngwa ngwa site na ijide ndị n’ere ma na-ekesa mkpụrụmmiri na Igbo ebe ọ dị ukwuu na Anambra steeti.

Kọmishọna Nnanna Oji kọwara na ọ bụ ụbọchị tuzde iri na otu nke ọnwa Ọgọst 2026 ka nnyocha ha n’eme ka mgbe iji chọpụta ndị na-ekesa mkpụrụ mmiri na ajọ anwụrụ ike mịtara mkpụrụ.

Ndị ọrụ uweojii Rapid Response Squad jidere chụrụ ha bata ebe ha ji mere ọdọ ọgwụ-ike n'Obosi dị ma n'Idemmili North Anambra steeti.

Ndị Omekome e jidere gụnyere out nwoke gbara afọ iri anọ na asaa, aha a na-etu ya bụ “Onyeoma”, onye nke abụọ e jidere bụ *nwoke* gbara afọ iri abụọ.

Nnyocha ndị RRS mere n’ụlọ ahụ gbara n’anwụ, nnukwu ọgwụ ike dị iche iche nke gụnyere mkpụrụ mmiri nke e ji “Crystal Methamphitamine” wee mara, Igbo a na-ese ese nke a kpọrọ “Cannabis Sativa” ọgwụ ndị a pụtara ego karịrị nde naira isii ebe ego enwetara n’ụlọ ahụ ruuru karịrị ọkara otu nde naira.

Nchọpụta ndị uweojii gosiri na ọ bụ ha na-ekesa ọgwụ ike na Anambra ma werekwa ya bụ ụlọ n’Obosi mere ebe ndị ohi n’abịa ezo ma ha zuchaa ohi.

Uweojii ṅụrụ iyi na ha ga ejide ndị otu ha gbara ọsọ oge ha wakporo ụlọ ndị omekome ahụ were kwuo na ha ga-achọpụtara ndị niile ha na e bugara ọgwụ-ike ahụ nakwa ebe ha si egota ya.

Nke a mere Kọmishọna Nnanna Oji Ama jiri yọọ ndị Anambra, ndị ọchịchị ime ime obodo, ndị ntorobịa na ndị obodo niile ka ha na-agbara ndị Uweojii ama ọsọ ọsọ, maka ihe ọjọọ ọbụla n’eme na gburugburu ha maka na emee ngwa emeghara ọdachi.