Kedụ etu ịnọdụ ala n'oche ọtụtụ awa si emetụta ahụ gị?
Ọtụtụ mmadụ na-anọdụ ala n'oche ruo awa iri kwa ụbọchị n'ụlọọrụ, n'ọgbakọ, maọbụ n'ihu ihe onyonyo bụ televishion.
Mana ịnọdụ ala ọtụtụ awa na-emegharịghị ahụ na ọnọdụ ahụike ọjọọ gụnyere ọrịa obi, ụdị ọrịa shuga a kpọrọ 'type 2 diabetes' n'olu Bekee na ọnwụ erughị eru, e nwere njikọ?
Nnyocha ahụike gosiri ọtụtụ mgbanwe na-eme mgbe ahụ mmadụ anaghị emegharị ruo ogologo oge:
Nke mbụ, ọrụ akwara ọkpụkpụ na-ebelata, nke a na-eme ka o siere shuga bụ 'glucose' ike ịgagharị n'ọbara nke ọma. Ka oge na-aga, nke a na-eme ka 'insulin' dị n'ahụ mmadụ ghara ịdị ike. Nke a bụ otu ụzọ mmadụ si ebute ọrịa shuga.
Nke abụọ, ọ na-eme ka usoro mgbari abụba n'ime ahụ mmadụ belatakwa n'ike.
Nke atọ, ịnọdụ ala n'oche ogologo oge na-eme ka ọbara ghara ịgbazu n'ahụ mmadụ nke ọma, na-ebelatakwa ikuku 'oxygen' na ihe oriri 'nutrient' na-abanye n'anụ ahụ. Nke a nwereike igbochi ọrụ akwara ma, mee ka ọbara mgbali elu dịkwuo elu.
N'eziokwu, mgbanwe ndị a na-eme ka 'metabolism' na etu ọbara si agagharị n'ahụ mmadụ na-agbanwee, ma na-akpalitekwa ọnọdụ ahụike ọjọọ gụnyere ohere inwe nsogbu obi, ọkwa shuga dị n'ọbara na 'cholesterol' gbalie ma mee kwa ka abụba na-eto n'afọ.
Nke anọ, ịnọdụ ala ogologo oge na-emetụtakwa usoro akwara dị n'ahụ mmadụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Nke ise, ịnọdụ ala ọtụtụ awa na-ebute ihe mgbu n'olu, n'ubu, nakwa ugwu azụ mmadụ. Nke a na-ebute ihe mgbu ndị a na-ahụkarị n'etiti ndị ọrụ bekee.
Nke isii, ọ na-ebute etinyeghị uche nke ọma na ike ọgwụgwụ. Nke a mere na ndị ọrụ bekee na-enwekarị ahụ erughị ala na enweghị ike ịrụ ọrụ nke ọma.
Kedụ ka ị ga-esi belata ihe ọghọm a?
Ndị ọkachamara kwuru na ọ dị mkpa ka mmadụ na-ebelata awa olee ọ nọdụrụ ala n'oche site na iguzo ọtọ maọbụ ịgagharị ihe dịka nkeji abụọ ruo ise n'ime nkeji iri atọ maọbụ otu awa ọbụla. Nke a nwereike ibulite usoro mgbari shụga ahụ bụ 'glucose metabolism' n'ahụ gị ma belata ihe egwu dịka ọrịa obi.
Ọ dịkwa oke mkpa na mmadụ na-eguzo maọbụ agbatị ahụ n'ụlọọrụ mgbe izukọ na-aga n'ihu.



