Onye ọkwọụgbọala ji akaodo kugbuo ọga ya nọ n'aka ndị uweojii ugbu a

Aha onyonyo, Onye ọkwọụgbọla ji akaodo kugbuo ọga ya nọ n'aka ndị uweojii ugbu a
Onye ọkwọụgbọala ji akaodo kugbuo ọga ya nọ n'aka ndị uweojii ugbu a
Mgbe e biputara ya

Aka ndị uweojii Anambra steeti akparala onye ọkwọụgbọala a na-enyo enyo na o zuru ọga ha ma jiri akaodo kugbuo ọga ya bụ onyeisi ụlọụka End-Reconciliation Ministry dị na Delta steeti.

Onye ọkwọụgbọala ahụ na ndị otu ya jiri akaodo na ihe ndị ọzọ kugbuo Bishop Okonkwo n'ụlọ ya na Ibusa, buru ego na ụgbọala Prado Jeep ya gaa na Nkpor dị n’okpuruọchịchị Idemmili North ka o ree ya.

Ama gbara ozigbo na ndị uweojii Rapid Response Squad (RRS) Awkuzu jidere nwoke ọjọọ ahụ na onye chọrọ ịzụ ugbọla ahụ e zuru n’ohi.

Kọmishona Orutugu dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla kpachapụ anya mee nnyocha nke oma banyere onye ha chọrọ inye ọrụ n’ụlọ ha, n’ihi na ọtụtụ mgbe ọ na-abụ oke nọ n’ụlọ n’agwa oke nọ n’ọhịa na azụ dị na ngịga.

Ndị uweojii Anambra kọwakwara ka ha siri zọpụta dọkịta Edwin Emegakor.

Komishona Orutugu kwuru na ọ bụ na abalị iri nke ọnwa Mee ka ha siri imi n’ala chọrọ ụgbọala RX 350 Lexus e zuru ezu bata na be nwoke ahụ a na-akpọ Fabulous onye na-azụ ahia na mgbuka.

Ndị uweojii n’onwe ha gbagbukwara ndị ntọrị mmadụ abụọ ndị otu Fabulous.

Ha tọhapụrụ mmadụ anọ atọọrọ nke otu onye n’ime ha bụ Dọkita Edwin Emegakor onye nwe Crown Multi specialist Hospital Nkpor.

Ha bughachitara ọtụtụ ụgbọala e zuru ezu, ego nakwa egbe na mgbọ dị iche iche. Onye nwe ụlọ ahụ bụ Maazị Fabulous nọ n'aka ndị uweojii ugbu a.

Ka ọ dị ugbu a gọọmenti Anambra steeti ewerela ụgbọala “Buldozer” kwatuo ụlọ ahụ dịka iwu siri kwuo.