Mene Ogidi: Ihe Onyeisi Uweojii Naijiria kwuru maka ogbugbu nwaokorobia a

Ebe foto si, Screengrab
Onyeisi ndị uweojii bu Tunji Disu ekwuola na nchọpụta ha mere gosiri na onye uweojii ASP Nuhu Usman na ndi uweojii so ya mebiri iwu 'Force Order 237' gbasara ojiji egbe, yana usoro ọrụ ndị ọzọ e guzobere n'ime ndị uweojii.
ASP Nuhu Usman gbagburu otu nwokorobịa gbara afọ 28 a na-enyo enyo n'anya ọcha na-enyeghị ohere ikpe ya ikpe, n'abalị 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2026 n'Effurun, Delta Steeti.
Onyeisi ndịuweojii bụ Disu katọrọ ogbugbu e gburu Mene Ogidi sị, "Ọrụ anyị bụ nchekwa ndụ, ọ bụghị igbu ọchụ."
Ọ gara n'ihu sị, "Ozugbo a chụpụrụ ha n'ọrụ, a ga-enyefe ndị uweojii ahụ niile n'aka ụlọikpe ka ha zaa ajụjụ maka mpụ ha."
IGP Disu kwuru na e nyefela akwụkwọ nchụpụ ha n'aka kọmishọn na-ahụ maka ọrụ ndị uweojii (PSC) ka ha kwado ya kpamkpam, dịka iwu siri dị.
Ndị uweojii sị na ha achụọla ndị uweojii niile aka ha dị n'ogbugbu nwaokoroọbịa a

Ebe foto si, NIGERIA POLICE
Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ha achụọla ndị niile nwere aka n'ogbugbu Mene Ogidi dị afọ 28 maka Effurun, Delta State, South-South Nigeria.
Ndị uwe ojii mara ọkwa a n'ụbọchị Wenezde 29 Eprel, 2026 ka ha mara onye uwe ojii jiri egbe gbabuo Ogidi n'ihu ọha dịka ASP Nuhu Usman.
"Dịka ntuziaka onye Inspector-General nke ndị uwe ojii, IGP Olatunji Rilwan Disu, ndị ọrụ niile metụtara ya bụ ihe a napụrụ ozugbo na Delta State Command wee bufee ikpe ahụ gaa na Force Headquarters dị n'Abuja, ebe ha mara ha ikpe na ngwa ngwa."
Kọmitii ịdọ aka na ntị nke Force (FDC), tinyere usoro ịdọ aka ná ntị nke nye ndị uweojii niile, kwubiri dia review, Force tok-tok pesin DCP Anthony Okon Placid kwuru maka nkwupụta a.
"Nchọpụta achọpụtala n'ezoghị ọnụ na onye isi ụlọ ọrụ, ASP Nuhu Usman, mere ihe megidere nnukwu iwu Force Order 237 na iwu ndị na-achịkwa iji egbe eme ihe.
Ndị uweojii ekwuola na a ga-ekpe onye otu ha gburu onye a na-enyo enyo ikpe maka igbu ọchụ
Ndị uweojii ekwuola na a ga-ekpe onye uweojii ahụ gbagburu onye a na-enyo enyo n'Effurun Delta Steeti ikpe maka igbu ọchụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti bụ Bright Edafe, kwupụtara nke a n'oge ụlọmgbasaozi Channels Tv na-agba ya ajụjụ ọnụ na Wenezde 29 Eprel, 2026, kwuru na ha nwụchiri onye uweojii ahụ gbagburu otu onye a na-enyo enyo na steeti ahụ.
Edafe kwuru na a kpọgara onye uweojii ahụ, aha ya bụ ASP Nuhu Usman, n'isi ụlọọrụ ndịagha dị n'Abuja ka e nye ya ntaramahụhụ ruuru ya.
N'ozi Edafe wepụtara n'akara X ya, Nuhu Usman gbagburu Mene Ogidi gbara afọ 28 n'ụzọ usoro ọrụ ha megidere.
Bright Edafe kwuru na omume Usman bụ nke a na-amaghị ka a ga-esi kọwaa ya, e wezuga maọbụ ihe sitere na mmụọ, ma kwuokwaa na ọdachi ahụ mere oge Mene gara izigara mmadụ ibu n'ọdọụgbọala.
Mgbe a jụrụ ya ihe mere e jiri kpuchie ihu Usman na foto ya ndị uweojii wepụtara, Edafe kwuru na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị.
Gịnị na-ese okwu n'etiti onye a na-enyo enyo na onye uweojii?

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na ogbugbu Usman gburu Mene Ogidi, kpalitere iwe n'ịntanetị.
Akụkọ kwuru na Mene gara n'ọdọụgbọala dị n'Effurun nke dị n'okporoụzọ Sapele iwere ibu mmadụ zitere ya. Oge o ruru, ha gwara ya tụkwasa ego n'ibu ahụ n'ihi na ọ dịtụ arụ. Ha jụrụ Mene ihe dị n'ime ibu ahụ mana ọ gwara ha na ọ bụghị ya nwe ibu ahụ kama ọ bụ mmadụ zitere ya.
Ha manyere ya ka o mepee ibu ahụ, ma chọpụta na ọ bụ egbe 'Beretta pistol' nakwa mgbọ egbe anọ bụ ihe dị n'ime ya. Ha jichiri ya n'otu ntabianya, mana ọ gwara ha na ọ bụ enyi ya rịọrọ ya ka o nyeere ya aka nweta ibu ahụ.
Akụkọ kwuru na Mene kwara akwa ka e meere ya ebere, ma kwuo na ya dị njikere iduru ha gaa n'ụlọ onye dunyere ya.
Na-ekwughị ekwu, na-akaghị aka, ndịisi ọdọụgbọala ahụ kechiri ya aka na ụkwụ ma mechie ọnụụzọ ọdọụgbọala ahụ iji gbochie ndị otu Mene ịbata. Ha kpọkwara onyeisi ndị uweojii na mpagahara Uvwie bụ Aliyu Shaba ka ọ bịa weghara okwu ahụ ma mee nnyocha miri emi.
A sị na Aliyu Shaba zigara Nuhu Usman a na-etu 'Ogbegbe' ka ọ gaa kpụta nwaokoroọbịa ahụ a na-enyo enyo n'ụlọọrụ ha.
Akụkọ kwuru na oge Nuhu garuru n'ọdọụgbọala ahụ wee hụ egbe ahụ, iwe juru ya obi, dịka isi bukwara ya maka ndị na-ajali ya n'ogige ahụ.
Ọ mịpụtara egbe ya ozugbo wee gbaa Mene n'aka, dịka ndị otu ya bubara Mene n'ime ụgbọala oge ọ ka na-eku ume.
E kwuru na oge ha ruru n'ụlọọrụ ndị uweojii, Usman gbakwara Mene egbe ugboro atọ ma gbagbuo ya.
Dịka akụkọ siri kọọ, Aliyu Shaba nụrụ ụda egbe ahụ ma gbapụta, nye iwu ka a napụ Usman egbe, tụọ ya ịga ma jichie ya na ndị uweojii niile ha na ya so.































