Ụfọdụ ndị na-eme ejije bụ ezigbo ndị ndu karịa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị - Emeka Ike
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Ị ma ihe ndị a na-eme oge a na-atụ vootu. Mgbe ahụ ka ụmụagbọghọ anyị na-echeta ịga kelee ndị enyi ha nwoke na ngwụcha izu.
Ha agaa mbọmchi, ha agaghị ebinye aka. Mgbe ahụ ka ọtụtụ ụmụokoroọbịa anyị ji ele ndị enyi ha nwaanyị ọbịa, ha ji ya mere ụbọchị ezumike.
Ọ bụ oge ahụ ka ndị ntoroọbịa ji agba bọọlụ n'okporoụzọ. Ihe ndị a bụ nsogbu anyị nwere na Naịjirịa.
Anyị tụọ vootu, ọ nwere ihe a na-akpọ mmeri dara ụda. Gị nwee ihe dịka nde vootu 80, onye nke ọzọ enweta [vootu] nde 9, gwa m etu ọ ga-esi mee ka o doo anya na ọ bụghị ya meriri ntụliaka ahụ.
Mana e nwee ihe dịka [vootu] nde 20, nde 21, nde 22.1, ọ bụ oge ahụ ka a pụrụ ịrụrụ aka. N'ụbọchị ntuliaka, onye niile nọ na Naịjirịa ka m na-arịọ ka ụnụ pụta tụọ vootu.
Ọ gwụchaala etu ahụ ka anyị pụrụ isi mezie Naịjirịa na-enweghị nkwatu ọchịchị maọbụ ibugharị egbe, ma o nweghịkwa onye ga-anwuchi gị.
Naanị nkwatu ọchịchị dị mma ma na-arụ ọrụ bụ PVC gị. A pụghị ịrụrụ aka na mmeri dara ụda.
Ana m achọ ịzọ ọkwa onye omeiwu nnọchiteanya etiti maka mpaghara Ama Bwari dị n'Abuja.
Pati m chọrọ iji aha ya zọọ ọkwa a bụ Nigeria Democratic Congress (NDC). Ihe kpaliri mmụọ m bụ maka na m bụ onye Naịjirịa, na m na-eme ejije Nollwood agụpụghị m dịka nwaafọ Naịjirịa.
Gị lee ejije ndị anyị na-eme na Nollywood, ị ga-achọpụta na anyị na-eme ihe bara uru karịa ọtụtụ ndị na-achị anyị na Naịjirịa.
Nke a bụ ihe anyị na-adịghị emeta nke ọma dịka ndị Naịjirịa. Anyị hapụrụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ dịzie ka ọ bụ ha nwe ya, na-azazi ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.
Jụọ ha ọrụ ha na-arụ tupu ha amalite igwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọtụtụ n'ime ha amaghị.
Ya mere, achọrọ m ịbata na ndọrọndọrọ ọchịchị ka m lee ihe ndị ụmụafọ Naịjirịa chọrọ a na-agọnarị ha.
Ha anaghị achọ ka e nye ha nde kwuru nde Naịra. Naanị ihe ha chọrọ bụ ihe ndị e ji enyere ndụ aka. Naanị ndị ga-enye ha ihe ndị a maọbụ mee ka ọ pụta ìhè bụ ndị Naịjirịa nwere ezi uche.
Tụnyere onye ahụ. Mana ndị a ga-ezuru ego kesaa ebe niile, ọ bụkwa etu ahụ ka ha ga-esi buru ego anyị bughachi ebe ha si bute nke ha jiri zọọ ntụliaka.
Ndị mmadụ agakwaa n'ihu na-ata ahụhụ ebighị ebi. Ya mere, anyị chọrọ ilebara ọtụtụ ihe anya, kwado iwu ndị ga-ahụ na a kagburu ọtụtụ ihe ka ndị Naịjirịa dịrị ndụ.
Ndị nọ na NDC bụ ndị nwere ugwu, ndị na-achọ ọdịmma ụmụafọ Naịjirịa. Ndị mmadụ ji ọsọ gbabata na pati ahụ.
Gị lee anya n'ọnụọgụ mmadụ nọ na ya ugbua, o doro m anya na o nweghị pati ọbụla nọ na Naịjirịa buru ibu etu ahụ. Ụjọ anaghị atụ anyị.



