Ihe mmụta dị na mmekọ azụmahịa n’etiti ụmụnne

Aha onyonyo, Ihe mmụta dị na mmekọ azụmahịa n’etiti ụmụnne
Ihe mmụta dị na mmekọ azụmahịa n’etiti ụmụnne
Mgbe e biputara ya

N'ụwa anyị nọ n'ime ya taa, enweela ọtụtụ akụkọ banyere esemokwu dapụtara n'etiti ụmụnne na-emekọ azụmahịa.

Nke a emeela ka ụfọdụ foro ntutu taa ma sị na kama ha na ụmụnne ha ga-emekọ azụmahịa nakwa ihe ọbụla gbasara ego, ọ kara mma na ha gara kpọọ onye ezi.

Ebe ndị ọzọ kwuru na ọ ka mma ha na nwanne ha imekọ azụmahịa maka na ha nwere ezi ntụkwasịobi n'ebe ha nọ.

Kedụ ihe ụfọdụ i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na gị na nwanne na-achọ imekọ azụmahịa maọbụ iho ọbụla gbasara ego iji chekwa onwe gị?

Ọkaiwu Chidi Ikeotunye kwuru na n'agbanyeghị na ọ dị mma ụmụnne imekọ azụmahịa, ọ dị mkpa ka e nwee ụfọdụ nkwekọrịta iji hụ na esemokwu agaghị adapụta n'ọdịnihu.

O kwuru na ọ dị mkpa ka ụmụnne ọbụla na-emekọ azụmahịa nwee otu obi nakwa nkwekọrịta banyere azụmahịa ha na-eme. Nke a ga-eme ka ha abụọ mara ihe ha bu n'obi mere ha ji eme azụmahịa ahụ.

Ọzọ bụ inwe ndekọ nkwekọrịta bekee kpọrọ 'Agreement' ọbụla ha nwere: Ọkaiwu Chidi kwuru na ụmụnne abụọ chọrọ imekọ azụmahịa, kwesịrị inwe nkwekọrịta gụnyere pasentị onye nwee, ego onye ọbụla tinyere na oge o tinyere ya, etu ha ga-esi kee ego, onye nwere ikike ikpebi ihe ga-eme nakwa usoro onye chọrọ ịpụ ga-esi pụọ. Ọ dị mkpa ka ụmụnnwe depụta ma binye aka na nkwekọrịta ndị a.

Inwe onye akaebe bụ ihe ọzọ dị mkpa oge ụmụnnwe abụọ na-emekọ azụmahịa ga-ebinye aka na nkwekọrịta ọbụla. Onye akaebe a ga-agba ama ma ọ bụrụ na a malite inwe esemokwu banyere nkwekọrịta ahụ n'ọdịnihu.

Ọzọ dị ka ibe ya bụ inwe ọkaiwu ga-abụ onye akaebe nke bekee kpọrọ 'notary public' oge ụmụnne abụọ na-ebinye aka na nkwekọrịta ọbụla. Gọọmenti nyere ndị ọkaiwu dị etu a ikike ịnọ dịka ndị akaebe iji nyochaa ma tulee akwụkwọ nkwekọrịta ọbụla.

Ịkọwa ọrụ dịịrị onye ga-eme ka onye ọbụla mara ọrụ ya. Ọ bụ etu a ka a ga-esi mara onye a ga-ata ụta ma ọ bụrụ na ọ rụghị ọrụ ya.

Iwepụ ihe ọbụla gbasara ezinaụlọ unu n'azụmahia: Ọgbakọ ezinaụlọ abụghị ọgbakọ azụmahịa. Okwu ọbụla gbasara azụmahịa abụghị okwu kwesiri ka a kpaa ya n'ọgbakọ ezinaụlọ.

Ikwu eziokwu banyere ego ọbụla e nwetara n'ihi na akwụkwọ nsọ kwuru na 'ego bụ mgbọrọgwụ ihe ọjọọ niile'.

Ọ dị mkpa ka ụmụnne nwee ndekọ zuruoke banyere ego ọbụla batara n'azụmahia ha. Nwee ụlọakụ pụrụiche ha ji eme azụmahịa nke onye ọbụla n'ime nwereike ịga ma hụ ihe na-eme na ya oge ọbụla nke bekee kpọrọ 'access to account'. Ihe dị etu a ga-akwalite ntụkwasịobi n'etiti ụmụnne abụọ na-emekọ azụmahịa.