'Anyị chere na ọ bụ naanị mmanya ọkụ' – Etu mmanya si buteree obodo ọnwụ ọtụtụ mmadụ

Ndị akụkọ gbasara
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Elo Moses, onye dị afọ 34 na-arụ ọrụ ịnya ọgbatumtum, arụchaala ọrụ ya n'ụbọchị ahụ mgbe o kpebiri iso ndị enyi ya gaa ṅụọ mmanya.

Mmiri ozuzo zoro n'ụbọchị ahụ, ebe niile adịkwa oyi, nke mere o ji chọọ ịṅụ ihe ga-eme ka ahụ dị ya ọkụ tupu ọ laghachi n'ụlọ.

Ya na ndị enyi ya abụọ gara n'otu ebe ha na-ezute aṅụ mmanya ọkụ e siri n'obodo. Ka nkeji ole na ole gachara, ahụ ya malitere ịgbanwe, e bugara ya ụlọọgwụ, ma ọ nwụrụ n'ebe ahụ.

Nwanne ya nwaanyị nke obere, AbigailMoses, onye ya na ya nọ obere oge tupu ọ nwụọ, kwuru na Moses mechara kwuo na ọ dị ya ka ọ bụ mmanya ọ ṅụrụ kpatara nsogbu ahụ.

Abigail kwuru sị, "Ọ bụ ịnya ọgbatumtum ka nwanne m nwoke ji ebi ndụ. Mmiri zoro n'ụbọchị ahụ, o wee gaa zụta mmanya. Ya na ndị enyi ya atọ gara ebe ahụ. Abụọ n'ime ha zụtara mmanya, ma onye nke atọ azụtaghị n'ihi na o nweghị ego.

"Mgbe nwanne m ṅụrụ mmanya ahụ, ọ rahụrụ ụra ozugbo n'oche. Ọ dịka ihe ahụ bidoro imetụta ya, ma ọ gwaghị anyị."

Abigail kọrọ na enyi nwanne ya mechara kpọọ nne ha tupu ha ebuga Moses ụlọọgwụ.

O kwuru na Moses agwaghị ha ozugbo na ọ bụ mmanya ahụ o ṅụrụ kpatara nsogbu ya.

 Moses Eno na ndị enyi ya nwụrụ mgbe ha ṅụsịrị mmanya ọkụ a gwọkọtara ọnụ
Nkọwa foto, : Moses Eno na ndị enyi ya nwụrụ mgbe ha ṅụsịrị mmanya ọkụ obodo ahụ a gwakọtara ọnụ

O kwuru na ọ bụ mgbe ọ nọ n'ọnọdụ ọnwụ ka o mechara kwuo na ọ dị ya ka ọ bụ mmanya ahụ kpatara ihe na-eme ya.

Ma mgbe o kwuru ya, oge agafeela, o nwezighị ihe onye ọbụla nwere ike ime.

"Ha gbara ya ọgwụ ma nye ya ọgwụ ndị ọzọ.

Ka o ruru mgbede, ọ naghịzi enwe ike ịkwụ ọtọ. Ihe ọbụla o riri maọbụ ṅụọ, ọ na-agbọsịsị ya. Afọ ya zara aza, ụkwụ ya ajụọ oyi, ọ dịkwa ka ọ naghịzi ahụ ụzọ."

Abigail kwuru na ọnwụ nwanne ya nwoke metụtara ezinaụlọ ha nke ukwuu, ọ kachasi n'ihi ụmụ atọ ọ hapụrụ.

Ọ sịrị na Moses bụ naanị nwanne nwoke o nwere, ma ugbu a, ha na-agbasi mbọ ike inye nwunye ya na ụmụ ya nri.

"Anya nwanne m na-eme m. Ọnwụ ya na-emetụta m. Nke a bụ nke mbụ m na-ahụ ụdị ihe a, ebe mmadụ na-anwụ ka ọkụkọ. A sị na o meghị m, agaghị m ekweta na ihe dị otu a nwere ike ime."

Moses abụghị naanị onye nwụrụ mgbe ọ ṅụsịrị mmanya ọkụ ahụ.

N'ọnwa Septemba 2026, ọtụtụ mmadụ malitere ịnwụ n'ọtụtụ obodo dị n' Ondo state, ebe ndị mmadụ mechara chọpụta na ọnwụ ndị ahụ esiteghị n'ọrịa nkịtị.

Ọnwụ ndị ahụ mere n'ime Okpuru Ọchịchị obodo Odigbo.

A kọrọ na ihe kpatara ọrịa na ọnwụ ndị ahụ bụ ịṅụ mmanya ọkụ a gwakọrọ ya na ahịhịa.

N'ime obodo isii e metụtara, Araromi-Obu bụ ebe ọnwụ kacha dị ukwuu, dịka ndị ọchịchị siri kwuo.

N'Araromi-Obu, ihe karịrị mmadụ 11 nwụrụ ozugbo, ebe a kpọgara ihe karịrị mmadụ 50 ụlọọgwụ.

Nnyocha ndị uweojii chọpụtara na ihe a gwakọtara n'ime mmanya ọkụ ahụ bụ methanol, kemịkal na-egbu mmadụ.

Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ adigboroja na Nigeria bụ 'National Agency for Food and Drug Administration and Control' (Nafdac) kwuru na e dekọrọ mmadụ 182 ọrịa ahụ metụtara, gụnyere ọnwụ mmadụ 48.

Ihe karịrị mmadụ 100 nọ n'ụlọọgwụ, ebe mmadụ ise kpuru isi kpamkpam.

Ka otu ọnwa gasịrị, BBC News Pidgin gara Araromi-Obu ka ha na ezinaụlọ ndị mmadụ ha nwụrụ na ndị zọtara ndụ kparịta ụka ya.

'N'ezinaụlọ m, ụmụnne m nwoke abụọ nwụrụ'

Otu n'ime akụkọ mwute BBC chọpụtara n'Araromi-Obu bụ nke ụmụnne nwoke abụọ bịara obodo ahụ maka agbamakwụkwọ, ma ha nwụrụ mgbe ha ṅụsịrị mmanya ahụ.

Adesebolu Adenikinju kwuru na obi gbawara ya mgbe o chetara ụmụnne ya nwoke abụọ; Adedayo Adenikinju na Kola Adenikinju bụ ndị nwụrụ n'otu ụbọchị.

O kwuru na ha amaghị na onye na-ere mmanya ahụ na-agwọkọta ya na ihe ndị ọzọ ruo mgbe ọnwụ malitere ịba ụba.

Otu onye zọtara ndụ ya gwara BBC na ọ ṅụrụmmanya ahụ ntakịrị , ma mgbe ahụ malitere inye ya nsogbu, ọ kwụsịrị ịṅụ ya.

Nnyocha NAFDAC na ndị uweojii

Ebe a bụ ụlọ ahịa ebe onye ahụ a na-enyo enyo nọ na-ere mmanya ahụ na-egbu egbu n'Araromi-Obu.

NAFDAC kwuru na ha malitere nnyocha iji chọpụta ihe dị n'ime mmanya ahụ kpatara ọnwụ ndị mmadụ.

Ụlọọrụ ahụ kwuru na nnyocha ha gosiri na mmanya ọkụ ahụ nwere 'cannabis indica' nakwa nnukwu'methanol' .

Ndị uweojii Ondo state kwukwara na 'methanol' dị n'ihe ọṅụṅụ ahụ kpatara ọnwụ ndị mmadụ n'Araromi-Obu.

Ndị uweojii kwuru na ha nwụchiri onye na-ere mmanya ahụ, onye a maara dịka "Meko".

Ndị BBC News Pidgin gbara ajụjụ ọnụ kpọkwara aha ya dịka onye ha zụtara mmanya ahụ n'aka ya.

Gịnị bụ methanol? Oleekwa ihe egwu ọ na-akpatara mmadụ?

Methanol bụ kemịkal a na-eji eme ihe n'ụlọọrụ mmepụta ngwaahia, ọ bụghị ihe mmadụ kwesịrị ịṅụ, n'ihi na ọ na-egbu mmadụ nke ukwuu.

Ịṅu ya obere nwere ike imebi ahụ mmadụ.

Dr Christopher Morris bụ onye nkuzi mahadum na 'Newcastle University', kwuru na methanol nwere ike imebi akụkụ ụfọdụ nke ụbụrụ.

O kwuru na ọ na-emetụtakwa anya ozugbo, nke nwere ike ime ka mmadụ kpuo isi.

Gịnị ga-eme ndị metụtara ya na ndị Araromi-Obu?

Onye ndu ndị ntorobịa Araromi-Obu bụ Dayo Akinro kwuru na ihe ahụ mere tụrụ ndị obodo ahụ n'anya, n'ihi na ọtụtụ mmadụ malitere ịnwụ n'otu oge.

O kwuru na ha chọpụtara na ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa ọrịa na mberede, ha wee buru ha gaa ụlọọgwụ.

O kwuru na mmadụ atọ nwụrụ n'ụbọchị mbụ, onye ọzọ anwụọ echi ya.

Akinro kwuru sị,"Ha niile kwetara na ha ṅụrụ mmanya ahụ. Ha niile nwere otu ụdị njirimara ọrịa. Ihe mbụ bụ na ha ga-amalite ikpu isi, mgbe awa ole na ole gachara, ahụ ha amalite ịma jijiji, mesịa ha anwụọ."

Onye ndu ndị ntorobịa ahụ kọwara na ha mere ngwa ngwa kpọọ oku maka enyemaka.

Ndị ọrụ ahụike gọọmentị bịara nyere aka buga ndị ọrịa n'ụlọọgwụ ma mee nnyocha.

Ọ bụ mgbe e mesịrị ka ha chọpụtara na ihe na-egbu ndị mmadụ abụghị mmanya nkịtị, kama ọ bụ 'methanol' na-egbu mmadụ nke a gwọkọtara n'ime ya.

Ugbu a, a machibidola mmanya ọkụ n'Araromi-Obu, ebe ndị obodo hiwere kọmitii na-enyocha ụlọahịa dị iche iche.