Ọ bụ gịnị na-eme n'ime otu Obidient Movement?

Aha onyonyo, O nwere ihe dị iche n’Obidient Movement na Obedient Movement?
Ọ bụ gịnị na-eme n'ime otu Obidient Movement?

Ọgbaaghara abanyela n'etiti otu ndị ntorobịa a ma ama na Naịjirịa kpọrọ onwe ha 'Obedient Movement' dịka otu ngalaba otu ahụ kwupụtara na ha achụọla Peter Obi n'ọkwa onye ndu ha.

N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ a haziri n'Abuja n'ụbọchị Tọzde 7 Mee 2026, onyeisi otu 'Obedient Movement' bụ Barry Avotu kwupụtara na Peter Obi na Tanko Yunusa abụghịzi ndị ndu ha. Avotu kọwara na otu ya anaghịzi ahụta ha dịka ndị na-achị nzukọ ahụ.

Onyeisi nchịkọta Obidient Movement bụ Yunusa Tanko gwara BBC News Igbo na ọ bụghị eziokwu na ndị otu ahụ na-ese okwu. Ọ kwupụtara na ha ka guzosiri ike n'azụ Peter Obi.

Tanko dọkwara aka na ntị ka ọhanaeze kpachara anya maka ndị na-ekwu na ha bụ ihe ha na-abụghị, ndị na-achọ ibute nkewa na mgbagwojuanya, ka ha wee mebie aha nzukọ ahụ.

"Anyị enweghị nkewa ọ bụla n'ime otu 'Obidient Movement'. Onye ndu anyi bụ Mazi Peter Obi," ka Yunusa kwupụtara, ma gbakwụnye na nzukọ ha lekwasịrị anya n'ịhụ na Obi nwetara tiketi ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027.

Na nzaghachi, Barry Avotu kọwara ihe niile Yunusa kwuru dịka okwu asị ma kwuo na ọgbakọ 'Obedient Movement' dị tupu Peter Obi abanye n'ime ya. Ọ kọwara na e hiwere nzukọ ahụ n'afọ 2022 mgbe ngagharịiwe EndSARS gachara, n'oge ndị ntorobịa gbara mbọ idebanye aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha bụ 'Nigerian Youths Democratic Party' (NYDP), mana ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ajụ ịdebanye aha ha n'akwụkwọ.

Avotu boro Peter Obi na Yunusa Tanko ebubo na ha ji aka ike napụ nzukọ ahụ n'aka ndị nwe ya. Ọ sịrị, "anyị chụpụrụ ha n'ihi na ha anaghị achị nzukọ a n'ụzọ kwụ ọtọ. Nzukọ Obedient karịrị otu onye; nzube anyị bụ iweta ezigbo ndụ na idebe iwu Naịjirịa."

Ọ gbakwụnyere na ọgbakọ 'Obedient' nweziri onwe ya ugbua, na ọ bụghị naanị maka Peter Obi ka ha ji nọrọ.

Avotu kwuru na nzukọ ha agaghị adaba n'aka otu onye, kama uche ha ghe oghe inyocha onye ọbụla nwere ikike ịchị Naịjirịa nke ọma n'afọ 2027.

O kwuru na ha nwereike inyocha Atiku, Wike, Amaechi, Sowore nakwa Peter Obi n'onwe ya. Ha sị na ha ga-eche ruo mgbe onye ọbụla pụtara ihe tupu ha ekpebie onye ha ga-akwado maka ịzọ ọkwa onyeisiala.