'Ịzụ ikpuru emeela anyị akajiakụ' - Ndị ọrụ ugbo

Aha onyonyo, 'Ịzụ ikpuru emeela anyị ndị akajiakụ'
'Ịzụ ikpuru emeela anyị akajiakụ' - Ndị ọrụ ugbo
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Henry Okonkwo
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Ndị na-azụ ikpuru akọwaala na ọtụtụ uru jupụtara na ngalaba ọrụ ugbo ahụ.

Ha nyere nkọwa a oge ha na BBC News nwere mkparịtaụka pụrụiche n'Owere dị n'Imo Steeti nakwa na Legọs Steeti.

Otu n'ime ha bụ Justin Nwosu kọwara na ọ bụrụ na mmadụ jide ego ma nwee obosara ala ebe ọ ga na-azụ ikpuru, na onye ahụ nwereike ịkpatara onwe ya ihe ruru nde Naịra iri abụọ na abụọ kwa afọ.

"Ọ bụrụ na i na-emepụta ya maka ire ya ere, ọ bụrụ na i ji ego, i nwereike ịmalite ya n'ala ruru otu plọọtụ, plọọtụ abụọ maọbụ atọ. Ị ga-ewepụtara ya ihe ruru nde Naịra 180 maọbụ 230".

"Naanị ịzụ ikpuru ga-enyenwu gị na ezinaụlọ gị nri, i nyekwa ndị mmadụ ọrụ," ka Maazị Justin Nwosu kọwara.

N'aka nke ọzọ, onye ọrụ n'ụlọọrụ Agmart dị n'Owere bụ Maazị Chi Okereke kọwaara anyị na ha na-eji ikpuru ndị ha na-azụ arụpụta nri ọkụkọ, nri azụ nakwa nri anụmanụ ndị ọzọ.

O kwuru na ha na-ejikwa ụmụ ureghure ndị ikpuru rifọrọ arụpụta ntụ akụkụ bụ 'fertilizer' nakwa nke ọzọ a na-akpọ 'frass'.

"Ihe anyị na-akpọ ahụhụ ndị a bụ 'black soldier flies' nke a na-eji ikpuru ya emepụta nri. Anyị zụọ ha, ha nwee mmekọ, ha yie akwa, ọ bụọ, nke a na-akpọ 'lava' apụta. Ọ bụ 'lava' ahụ ka anyị ji emepụta nri anụmanụ dị iche iche".

"Ọ bụrụ na 'lava' a richaa ihe dị n'ureghure, anyị ewere ureghure ndị nke fọrọ afọ mepụta ntụ akụkụ maọbụ nke a na-akpọ 'frass'," ka Maazị Okereke kọwara.

Ha mere ka anyị ghọta na ndị ọkachamara achọpụtala na o nweghị nje ọjọọ ọbụla dị n'ahụ 'black soldier fly'.