Ụlọikpe mba UK ekwuola na ọgbaegwu Poco Lee ga-apụta zara ọnụ ya maka ụfọdụ ebubo e boro ya

Ebe foto si, Poco Lee/Instagram
Ụlọikpe mba United Kingdom bụ Snaresbrook Crown Court ekwuola na onye ọgbaegwu a ma ama bụ Iweh Pascal Odinaka, nke ọtụtụ maara dịka Poco Lee, ga-apụta n'ihu ụlọikpe n'ọnwa Septemba na-abịa abịa iji zara ọnụ ya maka ebubo ụfọdụ e boro ya.
Ụlọikpe ahụ kwupụtakwara na Poco Lee ga-apụta zara ọnụ ya n'ụbọchị Tuzde abalị iri na ise n'ọnwa Septemba 2026.
N'akwụkwọ ozi ụlọikpe nyere BBC News Pidgin, ka o kwuru na Poco Lee ga-azara ọnụ ya maka ebubo dị iche iche ma nwetakwa ohere ịgwa ụlọikpe ma o kwetara ebubo ndị ahụ ka ọ ga-agọnarị ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Okwu gbasara Poco Lee ịpụ n'ụlọikpe malitere mgbe akụkọ gbasara na e jidere ya na mba United Kingdom na-efesasị n'ịtanetị.
Onye Naịjirịa bi n'UK bụ Benjamin Kuti, nke a na-akpọ 'Oluomo of Derby', bụ onye mbụ kwupụtara na ọgbaegwu Poco Lee nọ n'aka ndị uweojii na mba UK.
Kuti kwuru na mpụta n'ụlọikpe ya na Septemba bụ ebe a ga-atụ anya ka Poco Lee zara ọnụ ya gbasara ebubo ndị eboro ya.
O kwukwara na ya ga-aga n'ụlọikpe iji kwado Poco Lee.
Onye bụ Poco Lee?
Poco Lee, onye ezigbo aha ya bụ Iweh Pascal Odinaka, bụ onye a ma ama na-agba egwu, bụrụkwa otimkpụ, ma na-eme ejije.
A mụrụ ya na 21 Ọktọba 1996. Ọ bụ onye Orlu dị n'Imo Steeti, mana o tolitere n'okpuruọchịchị Ojo dị na Legọs steeti.
A malitere ịnụ aha ya n'ihe dịka afọ 2018 mgbe ihe onyonyo ebe ọ na-agba egwu 'Zanku/ Legwork' fesara n'akara sọshal midịa.
Onye egwu bụ Zlatan Ibile mechara hụ onyonyo ahụ ma soro ya rụọ ọrụ, nke nyere Poco Lee ohere ịbanye n'etiti ndị a ma ama n'ụlọọrụ egwu Naịjirịa.
Kemgbe ahụ, Poco Lee esorola ọtụtụ ndị egwu a ma ama rụọ ọrụ, gụnyere Davido, Wizkid, Burna Boy, Tiwa Savage na Naira Marley.
Poco Lee gụrụ Microbiology na Mahadum Lagos Steeti bụ Lasu.
































