A nabatala mmadụ 163 ndị ojiegbe tọọrọ n'obodo Woro, Kwara steeti
Gọvanọ Abdulrahman Abdulrazak na-achị Kwara steeti anabatala mmadụ 163 ahụ ndị ojiegbe tọọrọ n'obodo Woro dị n'okpuru ọchịchị Kaiama nke steeti kemgbe ọnwa Febụwarị, 2026.
Nke na-abịa dịka ndị ọrụ nchekwa zọpụtara ndị ahụ na mpgahara ogige Kainji National Park dị na Niger steeti.
Gọvanọ Abdularazak na ndị obi ọchịchị ya, ndị Eze ọdịnala nakwa ndị ọrụ nchekwa na steeti ya nabatara ndị ahụ a zọpụtara n'ogige ụlọ oriri na ọṅụṅụ Royalton Hotel dị n'Ilọrin, isiobodo steeti ahụ.
Onyeomeiwu na-anọchiteanya Woro n'ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Abdulahi Halidu Danbaba, gwara BBC na ndị ahụ a tọọrọ gụnyere ụmụnwoke, ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka, tara ahụhụ dị iche iche n'aka ndị ojiegbe ahụ tọọrọ.
Otu nwaanyị so na ndị a zọpụtara kwuru na agwọ tara mmadụ atọ n'ime oge e ji ha.
O kwukwara na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ha liri ozu mmadụ iri abụọ na ise nwụrụ n'ogige ha.
Kọmishọna ndị uweojii na Kwara steeti bụ Adekimi Ojo gwara BBC na ọ bụ mbọ ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa ime obodo gbara, mere e ji chọpụta ebe ndị ntọ ahụ nọ ma zọpụta ndị ahụ ha tọọrọ kemgbe ọnwa isii gara aga.
Ụfọdụ ndị obodo Woro kọwara obi ụtọ ha ma kwuo na ọ dị mkpa ka gọọmenti gbaa mbọ iji hụ na ndị ọrụ nchekwa nwere nkwado zuruoke iji hụ na e nwere ezi nchekwa na Naịjirịa.



