Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gharịpụrụ nna ha n'Abraham n'Afrịka

Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gharịpụrụ nna ha n'Abraham n'Afrịka
Mgbe e biputara ya

Ị nụla maka ihe na-eme na mba Senịgal, ebe Onyeisiala Diomaye Faye chụrụ enyi ya nwoke bụ Ousmane Sonko ya na ya soro taa ahụhụ maka ịhụ na ezi ọchịchị kwụrụ chịm na mba Senịgal.

Cheta na Macky Sall bụbu onyeisiala Senigal tụrụ Ousmane Sonko mkpọrọ oge ọ nọ n'ọchịchị ma sị na o tozughị oke ịzọ ọkwa ọchịchị, mere Bassirou Diomaye Faye ji were ọkọlọtọ pati PASTEF nweta mmeri maka ọkwa onyeisiala mba ahụ.

Faye nyere Sonko ọkwa Praịm Minista oge e duchara ya n'iyi ọrụ, mana ugbua, mmiri ejula awọ ọnụ, Faye wee chụọ Sonko n'ọrụ dịka Praịm Minista ma nyefee ọkwa ya n'aka Ahmadou Al Aminou Lo. Malik Ndiaye bụ Onyeisi Ụlọomeiwu Senịgal sokwara Sonko gbaa arụkwaghịm.

Nke a bụ etu mmekọrịta dị n'etiti ndị enyi abụọ a si gbaa ụka, mana nke bụ eziokwu bụ na ọ bụghị sọọsọ na Senịgal ka o mere.

O mere na mba Angola ebe Onyeisiala Jose Dos Santos chịrị mba ahụ ihe ruru afọ iri anọ, ma n'afọ 2017 o kpebie ịhapụ ọchịchị, họrọ Onyeisiala Joao Lourenco ka ọ nọchie anya ya. Ma n'ihe tụrụ ọha n'anya, Lourenco malitere ibuso ezinaụlọ Santos agha ozugbo ọ banyere n'ọchịchị, ma na-enyocha ha maka mpụ. Nke a mere ka Dos Santos gbara ọsọ ndụ gaa mba Spen ma mechaa nwụọ ebe ahụ.

Na mba DR Kongo, Onyeisiala Felix Tshisekedi meriri ntuliaka n'afọ 2019 ka a sị ya na onye bụbu onyeisiala mba ahụ ihe ruru afọ iri abụọ bụ Joseph Kabila nwere nkwekọrịta nzuzo. Ha hiwere gọọmenti njiko ka e mechara ntuliaka iji hụ na ndị otu Tshisekedi na Kabila sonyere n'ọchịchị. Mana ka e mesịrị Onyeisiala Tshisekedi kposara gọọmenti njikọ ahụ, dịka a malitere ibuso Kabila agha ruo ugbua maka ebubo ịkwado ndịagha nnupuisi M23. Ka ọ dị, a maala Kabila ikpe ọnwụ n'azụ ya.

Ugbua ka anyị chewe ihu na mba Kameruun, ebe onyeisiala mbụ chịrị mba ahụ bụ Ahmadou Ahidjo gbara arụkwaghịm n'ọnwa Nọvemba 1982 n'ihi ọnọdụ ahụike ya ma nyefee ọchịchị n'aka Paul Biya, onye bụ Praịm Minista n'oge ahụ nakwa onye iwu kwadoro ịnọchi anya ya, n'agbanyeghị na ọ gara n'ihu nọrọ n'isi pati ha. Esemokwu dapụtara n'etiti Ahidjo na Biya nke mere ka Ahidjo gbaa ọsọ ndụ n'afọ 1983 ma gbagaa mba Senịgal. E mechara boo ya ebubo ịkpa nkata nkwatu ọchịchị megide Paul Biya n'afọ 1984. Oge ọ nwụrụ, e liri ozu ya na mba Senịgal, ruo taa, e bulatabeghị ozu ya na mba Kameruun.

A bịa na Naịjirịa, a hụtara ụdị ọnọdụ a mgbe Bola Tinubu nyere aka tinye onyeisiala pụrụ apụ bụ Muhammadu Buhari n'ọchịchị, mana ka o ruru n'afọ 2023 ya onwe ya pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala, ọ malitere ibo Buhari ebubo ịgba ya mgba okpuru.

Na Riva Steeti ka Rotimi Chibuike Amaechi na nna ya ukwu bụ Peter Odili mechara tinye ụkwụ n'otu ọbante. Nyesom Wike na Rotimi Chibuike Amaechi na Goodluck Jonathan nwekwara nsogbu nke ha, ebe aka na-achị Riva Steeti ugbua bụ Siminalayi Fubara na Nyesom Wike bụ nna ya n'Abraham nwekwara katakata nke ha.