"Anyị na-achọ ndị ntọrị wakporo ụlọụka Katoliki n'Enugwu Steeti"

Aha onyonyo, Amalitela ịchọ ndị ntọrị wakporo ụlọ ụka Katoliki n'Affa Enugwu steeti.
"Anyị na-achọ ndị ntọrị wakporo ụlọụka Katoliki n'Enugwu Steeti"
Mgbe e biputara ya

Akụkọ pụtara n'ụtụtụ Sọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọgọst kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Joseph Katọlik dị n'obodo Inoyi Affa nke okpuruọchịchị Udi n'Enugwu Steeti.

N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ndị obodo ahụ na-eti mkpu ma kọwaa na ndị ojiegbe tọọrọ otu onye Seminarịa, otu katikist na otu onye ọzọ mgbe ha na-akwado imalite ofufe n'ụlọụka ahụ.

Ha kwuru na ndị ojiegbe a ruru mmadụ iri bucha egbe AK47 ma na-agbali ya elu dịka ha kpọọrọ mmadụ atọ ahụ si n'ụlọụka na-apụ nke mere na ndị mmadụ enweghi ike chụnwuo ha ọsọ.

Otu nwoke na-ekwu okwu n'ihe onyonyo ahụ na-akpọghị aha ya sị na e mechara tọhapụ katikist ahụ ma jidezie onye seminarịa na otu onye ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị obodo pụtara n'igwe ma kpagharịrị n'ime ọhịa ịchọpụta ebe ndị a zoro mana o nweghizi ndị ha hụrụ.

Onyeisioche okpuruọchịchị Udi bụ Ogbonnaya Agu mechara duru ndị ọrụ nchekwa wuchie n'obodo ahụ mana ha ahụghị ndị ntọrị ahụ.

Kọmishọna Uweojii Enugwu Steeti bụ Mamman Bitrus Giwa kwuru na ha ehiwela otu ndị ọrụ nchekwa 'Joint Task Force' n'obodo Inoyi Affa ebe ihe a mere.

Giwa kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa chụrụ ndị ntọrị a ọsọ nke mere ha jiri hapụ otu onye n'ime ndị ha tọọrọ.

Giwa kwere nkwa na aka ndị ọrụ nchekwa ga-akpara ndị ahụ n'oge na-adịghị anya.

Ọ gwara ndị mmadụ ka ha weta ozi ịgba ama ọbụla ga-enye aka ijide ndị omekome ahụ ma zọpụta ndị ahụ ha tọọrọ ozigbo ozigbo.