Ihe ise mere dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ Osun steeti
Dịka a na-akwadobe ime ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Osun steeti n'ụbọchị Satọde 15 Ọgost, 2026, e weela ọtụtụ okwu a kpụ n'ọnụ nakwa ihe ndị ọzọ dị oke mkpa banyere ntuliaka a.
Gịnị mere ntuliaka a ji dị mkpa?
Nke mbụ bụ na nke a bụ ugboro asaa a na-eme ntuliaka ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ kemgbe ọchịchị onyekwuouche ya malitere na Naịjirịa n'afọ 1999.
Ntuliaka a so na ntuliaka bekee kpọrọ off cycle election a na-eme na Naịjirịa. Ihe kpatara nke a bụ maka na ụlọikpe wepụrụ otu gọvanọ na steeti ahụ n'ime afọ atọ n'ọchịchị ya ma tinye onye ọzọ dịka Gọvanọ.
Ụfọdụ ihe emeela dịka a na-akwado ime ntuliaka a.
Nke mbụ bụ na Gọvanọ Ademola Adeleke pụtara kwuo na a na-egbu ọtụtụ ndị nkwado pati ya na steeti ahụ.
Nke abụọ bụ na ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) nọrọ n'ụbọchị Wenezde 5 Ọgọst, 2026 machie ọbaego ụlọakụ gọọmenti Osun steeti.
EFCC kwuru na ha mere nke a n'ihi nnyocha nrụrụaka ha na-enyocha gọọmenti Osuna steeti. Mana Onyeisiala Tinubu mechara nye EFCC iwu ka ha wepụ Mmachi ahụ ngwangwa.
Gọvanọ Edo steeti bụ Monday Okpebholo kpọrọ oku ka ndị Osun steeti binyere pati APC aka na ntuliaka a iji wepụ Gọvanọ Adeleke onye o kwuru na ọ bụ naanị egwu ka ọ maara agba.
Gọvanọ Adeleke zaghachiri okwu a ma kwuo na ọchịchị ya arụọla nnukwu ọrụ dị iche iche.
O kwuru nay a dị njikere ikuziri Gọvanọ Okpebholo etu e si agba egwu ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịmụta.
Ọzọ dịka ibe ya bụ ozi David Adeleke a maara dịka Davido wepụtara na soshal midia ebe ọ nọrọ kpọkuo Onyeisiala Donald Trump mba Amerịka ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka iji hụ na ntuliaka a gara n'ụzọ iwu kwadoro.
Ọtụtụ mmadụ katọrọ ozi Davido ma kwuo na ọ bụghị ihe kwesiri.
A dị pati 14 na-azọ ntuliaka a mana mmadụ atọ a ma ama bụ Gọvanọ Ademola Adeleke nke pati Accord, Asiwaju Bola Oyebamiji nke All Progressive Congress (APC) nakwa Najeem Folasayo Salaam nke pati African Democratic Congress (ADC).
Ọzọ bụ na ihe onyonyo fesara na soshal midia gosiri ebe Sinetọ Francis Fadahunsi na-anọchiteanya Osun East n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa nọ na-akpọ oku ka ndị nkwado pati APC n'Osun steeti gbuo ndị nkwado pati Accord ọbụla ha hụrụ. Nke a mere ka ndị uweojii Osun steeti kpọọ ya oku ka ọ bịa kọwaara ihe oku ahụ ọ na-akpọ pụtara.
Kemgbe e kewapụtara Osun steeti n'afọ 1991, mmadụ iri achịala steeti ahụ dịka gọvanọ nakwa onyeisi ọchịchị ndịagha.
Ndị ahụ Segun Ajiborisha, Isiaka Adeleke, Anthony Udofia, Anthony Obi, Theophilus Bamigboye, Bisi Akande, Olagunsoye Oyinlola, Rauf Aregbesola, Gboyega Oyetola nakwa onye ji ọkwa Gọvanọ ugbua bụ, Ademola Adeleke.



