Achọrọ m ikpe ziri ezi n'ọnwu nwa m - Nna Wendy Achumba
Mazị Meregini Jerry Achumba, akpọọla oku ka gọọmenti na ndị ọnụ na-eru n’okwu, rụọrụ ma hụ na ndị gburu nwa ya nwaanyị bụ Wendy Achumba nwetara ntaramahụhụ dịka iwu si kwuo.
Jerry Achumba kpọrọ oku a oge ya na BBC Nes Igbo nwere mkparịtaụka dịka akụkọ gbara n’anwụ na e gburu nwa ya bụ Wendy ma bekasị ahụ ya n’ụlọ obibi ya dị n’Obowo dị n’imo steeti.
Ọ gara n’ihu kwuo na ya amaghị ihe mere e ji akpọ oku ka e mee nnyocha autopsy ebe ndị uweojii nwụchiri ndị kwuru na ọ bụ ha ji mma bepụ olu Wendy ma gbuo ya.
“Abụ m onye nkụzi, wneghị m ego ime nnyocha autopsy, ihe m na-arịọ bụ ka nwa m lara mmụọ nweta ikpe ziri ezi”, ka o kwuru.
Ndị obodo Umuokahia 2 dị n'okpuru ọchịchị Obingwa n'Abia Steeti nakwa ndị ezinaụlọ, na ndị enyi Wendy Achumba e kwuru na e gburu ma bekasịa ahụ ya n'ụlọ obibi ya dị n'Obowo dị n'imo steeti emeela ngagharịiwe ma kpọọ oku maka ikpe ziri ezi n'ọnw ya.
Ndị ahụ mere ngagharịiwe yi uwe ojii ma gagharịa n'obodo ahụ dịka ha ji akwụkwọ e dere ihe dị iche iche n'iji akpọ oku ikpe ziri ezi n'ọnwụ Wendy.
Onyeisi obodo Anunu Ukwu bụ Temple Okeugo, onyeisi ụmụnwaanyị obodo ahụ bụ Rose Ukaegbu nakwa onyeisi ndị ntrorobịa obodo ahụ bụ Onozie Ugwumba, kpọrọ oku ka gọọmenti kpee ndị ahụ aka ha dị n'ọnwụ Wendy ikpe dịka iwu si kwuo.
Ha kwuru na ikpe ziri ezi ha chọrọ bụ ka a maa ndị ahụ aka ha dị n'ọnwụ Wendy ikpe ọnwụ.
Eze Odinala obodo ahụ bụ Eze Kachi Grant Nwankwu, gwara ndọ obodo ahụ ka dere juu ma kwuo na nye ohere ka ndị ọ dị n'aka rụọ ọrụ ma kpe ikpe banyere ọnwụ Wendy.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde 22 Mee 2026 ka ụlọakwụkwọ College of Nursing Sciences Ụmụlogho wepụtara ozi ma kwuo na obi agbawaala ha gbasara ọnwụ Wendy. Ha kasiri ezinaụlọ ya obi ma kwuo na ha enyela mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii.
N'ozi ndị uweojii Imo Steeti wepụtara n'ụbọchị Tọzde ahụ, ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye sịrị na ha nụrụ maka njinji ahụ ma gbara ọsọ gaa ebe ahụ iji were anya ha hụ. O kwuru na ndị uweojii butere ozu nwaagbọghọ ahụ ma bugaa ya n'ọbaozu, dịka ha maliterela ime nnyocha iji chọpụta ndị aka ha dị n'arụ ahụ ma nwuchie ha.
Ndị uweojii rịọrọ ụmụakwụkwọ na ọhanaeze ka ha dere duu, ma kwee nkwa na ha na-agbasi mbọ ike iji hụ na ndị kpara arụ ahụ gbara nkwa nke iwu obodo ga-akụrụ ha.



