Aṅulika Nwokike Onyeanusi agọọla na o metọghị ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ n'ebubo gọọmenti Anambra State boro ya

Aṅulika Nwokike Onyeanusi a na-ebo ebubo ịrụnye ụmụ ya ndị nwaanyị amụ rọba n’ọtụ, ike na ọnụ yi akwa ojii kwụrụ n'ime ụlọikpe
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Aṅulika Nwokike Onyeanusi dị afọ iri atọ na ise (35) ekwuola na aka ya dị ọcha n'ebubo iri na anọ (14) gbakwasịrị ụkwụ na mmetọ ụmụaka gọọmenti Anambra state boro ya.

Gọọmenti Anambra state na-ebo ebubo na Aṅulika maara ụma rụnye ụmụ ya ndị nwaanyị amụ rọba n'ọtụ, ike nakwa n'ọnụ ha.

E kwuru na ọ bụ ebe ha bi na No. 11, Ezego Ojoto Street Akpaka GRA Onitsha dị n'Anambra state ka nwaanyị a nọọrọ kpaa arụ ndị a.

N'ebubo nke mbụ na nke abụọ, gọọmenti Anambra state kwuru na Aṅulika rụnyere amụ rọba n'ọtụ, ike nakwa ọnụ ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ dị afọ itoolu na asaa n'otu n'otu, bụ nke megidere Mpaghara 3(2) nke Iwu Machibidoro Imeso Mmadụ Omume Ike nke afọ 2017 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

N'ebubo nke atọ na nke anọ, gọọmenti Anambra state sịrị na Aṅulika maara ụma rụnye amụ rọba n'ọtụ, ike nakwa ọnụ ụmụ ya ndị nwaanyị ahụ dị afọ itoolu na asaa a na-akpọghị aha, nke megidere Mpaghara 27 nke Iwu Machibidoro Imeso Mmadụ Omume Ike nke afọ 2017 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

N'ebubo nke ise na nke isii, e kwuru na nwaanyị ahụ ji ụmụ ya ndị nwaanyị dị afọ itoolu na asaa na-emepụta onyonyoo ndị gba ọtọ, bụ nke megidere Mpaghara 33(3) nke Iwu na-echekwa Ikike dịịrị Ụmụaka nke afọ 2006 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

N'ebubo nke asaa na nke asatọ, gọọmenti Anambra state kwuru na Aṅulika na-emetọ ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ site n'imeso ha omume akwamiko, nke megidere Mpaghara 35(3) nke Iwu na-echekwa Ikike dịịrị Ụmụaka nke afọ 2006 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

N'ebubo nke itoolu na nke iri, a na-ekpe Aṅulika ikpe maka iji ike manye ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ ka ha kwaa iko, na-agbanyeghị ihe omume a nwereike ibutere ọnọdụ ahụike ha nke anụarụ na nke echiche.

Ha kwuru na omume a megidere Mpaghara 7(1) nke Iwu Machibidoro Imeso Mmadụ Omume Ike nke afọ 2017 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

Ndị Ọkaiwu yi uwe njirimara ha nọrọ n'ime Ụlọikpe Ukwu Anambra State

N'ebubo nke iri na otu na nke iri na abụọ, a sịrị na Aṅulika metọrọ uche na echiche ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ, nke megidere mpaghara 16(1) nke Iwu Machibidoro Imeso Mmadụ Omume Ike nke afọ 2017 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

N'ebubo nke iri na atọ na nke iri na anọ, gọọmenti Anambra state kwuru na nwaanyị ahụ maara ụma tinye ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ n'ụjọ mmerụahụ, nke megidere Mpaghara 6(1) nke Iwu Machibidoro Imeso Mmadụ Omume Ike nke afọ 2017 e tinyere n'iwu n'Anambra state.

Ka ọ dị, oge a gụpụtachara ebubo niile a n'ihu nwaanyị ahụ na-azara ọnụ ya bụ Aṅulika Nwokike Onyeanusi, o kwuru na aka ya dị ọcha.

N'ihi nke a, Ọkaikpe Peace Otti nke Ụlọikpe Ụmụaka, Mmetọ Mmekọahụ na Omume Ike Gbakwasara Ụkwụ n'Ụdị Ekere dị n'Ụlọikpe Ukwu Anambra State yigharịrị ikpe a gaa n'ụbọchị 27 Nọvemba 2026 maka ịchabi ikpe n'arịrịọ ntọhapụ beelụ.

Cheta na ndị uweojii Anambra steeti nwụchiri Aṅulika Nwokike Onyeanusi n'ọnwa Septemba, 2026 maka ebubo metụtara imetọ ụmụaka site n'igosi foto na onyonyoo mmekọahụ ụmụaka a kpọrọ "Child Pornography".