Onye bụ Ugo Ugochukwu tuuru ugo n’egwuregwu Formula 3 na mba Amerịka?

Aha onyonyo, Onye bụ Ugo Ugochukwu tuuru ugo n’egwuregwu Formula 3 na mba Amerịka?
Onye bụ Ugo Ugochukwu tuuru ugo n’egwuregwu Formula 3 na mba Amerịka?
Mgbe e biputara ya

Site n'ịkwọ ịnyịnya 'kart' oge ọ dị afọ isii ruo n'ịbụ ọkaibe n'egwuruegwu 'Formula 3', ihe a bụ akụkọ Ugo Ugochukwu.

A mụrụ ya na New York n'afọ 2007. Nna ya bụ Luca Orlandi bụ nwaafọ Ịtali ebe nne ya bụ Oluchi Onweagba bụ onye Isiukwuato dị n'Abịa Steeti.

Ugo malitere ịkwọ ịnyịnya 'kart' oge ọ dị naanị afọ isii. Ọ gakwaala n'ihu na-emeri kemgbe ahụ.

N'afọ 2020, o ritere nturuugo FIA European Junior Championship, nke bụ otu n'ime ụfọdụ ịgba ndị gbara ọkpụrụkpụ o tiri dịka onye na-eto eto. Ugbua, o meela ihe tụrụ ụwa n'anya ọzọ.

Ugo ji akara iri na anọ merie Freddie Slater bụ nwaafọ Briten mara ya aka iji turu ugo n'ịmaaka FIA Formula 3 championship na Spanish Grand Prix, nke mere ya onye Amerịka mbụ ga-erite nturu ugo ahụ.

Mana e wezuga nke a, Ugo kwuru na o nwere njirimara ya ọzọ o ji akpa nganga. Nke bụ maka na mgbọrọgwụ ya dị na Naịjirịa.

Dịka o lekwasịrị anya ugbua n'ogogo nke ọzọ n'egwuruegwu ụgbọala, ọkwọụgbọala a na-eto eto bụ onye e kwesịrị ikiri ekiri.