Ghana-must-go: Akpa e ji akọ akụkọ nchụpụ ndị mbịarambịa n'Afrịka
A na-eme ngagharịiwe na Saụt Afrịka dịka ụmụafọ mba ahụ na-akpọ oku ka ndị mbịarambịa akwụkwọ ha na-ezughị oke kwapụ na mba ahụ.
Mana ihe a abụghị oge mbụ ihe dị etu a na-eme na mba dị n'Afrịka.
N'afọ 1983, ngagharịiwe e mere megide ndị mbịarambịa na Naịjirịa, bụ ya butere otu oku na-ewu ewu bụ "Ghana Must Go".
Mmanụ agbidi bịara jupụta na Naịjirịa n'ime afọ ndị 1970, dịka ha pụrụ n'aka ọchịchị mba Briten n'afọ 1960.
Ndị mbịarambịa si mpaghara Afrịka ndị ọzọ nubatara n'ìgwè ịchọ ohere ọrụ. N'ime ha bụ ọtụtụ ụmụafọ mba Gana.
Na mmalite, akụnaụba Naịjirịa mere nke ọma, mana dịka a banyere n'afọ ndị 1980, o bidoro ịnyụ ka ọkụ.
Ndakpọ ọnọdụ akụnaụba na mbaụwa, ọnụahịa mmadụ na-ada mba na enweghị ezi ọchịchị mere ka nsogbu akụnaụba mekpaa Naịjirịa ahụ.
Ọ bụ n'oge dị etu a ka ụfọdụ ndị Naịjirịa malitere ime ngagharịiwe megide ụmụafọ Afrịka ndị ọzọ bi na Naịjirịa, ndị ha boro ebubo ịnapụ ha ohere ndị ruuru ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
N'afọ 1983, onyeisiala n'oge ahụ bụ Shehu Shagari nyere iwu ka a chụlaa ndị mbịarambịa aha ha na-anọghị n'akwụkwọ.
Dịka akwụkwọ akụkọ New York Times sịrị kwuo, ọ bụ ndị Gana kachasị n'ọnụọgụ n'ime ndị a gwara ka ha laa.
Mana gị lezie ya anya, ọ dịkwa ka ọ bụ ndị Gana kụziiri ndị Naịjirịa omume dị etu a.
Oge ha nwerechara onwe ha n'afọ 1957, akụnaụba mba Gana magburu onwe ya na mma.
N'afọ 1969, Praịm Minista Gana n'oge ahụ bụ Kofi Abrefa Busia nyere iwu ka a chụlaa ọtụtụ ndị mba ọzọ, nke ndị Naịjirịa kachasị n'ime ha.
Mba Gana no na-enwe nsogbu akunuba na enweghi oru mgbe ahu. Ndi mbiarambia ka asi kpatara ya
Ya mere, ka o ruru n'afọ 1983,ụfọdụ ndị Naịjirịa hụtara ohere ahụ dịka oge mmegwara.
Ọtụtụ ndị Gana kwakọtara ibu ha n'ime akpa plastik dịka nke a, nke e mechara malite ịkpọ "Ghana Must Go".
Ọ bụkwa aha a ka ọtụtụ ndị Naịjirịa ji mara akpa a ruo taa.
Ọ bụ etu a ka akpa a nwereike isi kọọ nnukwu akụkọ gbasara ime njem n'Afrịka nakwa nchụpụ malitere n'oge nnwereonwe mba Gana ruo na mba Saụt Afrịka taa.
Ihe dị iche bụ na gọọmentị Naịjirịa na nke Gana bụ ha nyere iwu ka ndị mbịarambịa na-ejighị akwụkwọ laa, mana ugbua, ọ bụ umuamaala na-eme ngagharịiwe nke na-akpalite ụjọ, ma na-emekwa ka ọtụtụ ndị Afrịka bi na Saụt Afrịka laa, ma ndị nwere akwụkwọ ma ndị na-enweghị akwụkwọ.
E nwere otu ihe na agbanwebeghi, mgbe obula enwere nsogbu akunuba na mba kachasi enweghi oru, goomenti maobu ndi amala mba ahu na asi na o bu ndi biara abia kpatara ya.



