Gọọmenti ọ chọrọ iji adire gbanwee uwe njirimara NYSC?
Ebe niile ebirila ọkụ kemgbe a sị Minista na-ahụ maka ndị ntoroobịa na Naịjirịa bụ Ayodele Olawande kwuru na a ga-eji akwa 'adire' gbanwee uwe njirimara NYSC mgbe ọ na-aza ajụjụ n'ihe omume tivii.
Mana n'ozi o wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị 2 Julaị 2026, Olawande gọrọ aka na ụkwụ ya sị, na o nweghịkwa mgbe ọbụla o kwuru na ọ bụ akwa adịre ka a ga-eji gbanwee uwe njirimara NYSC, kama na ya rụtụrụ aka n'ụdịrị akwa dị iche iche gụnyere 'adịre', 'ankara' na ndị ọzọ.
Ọ sịrị na ihe gọọmenti na-achọ bụ akwa ga-eme ka ndị na-efe ala nna ha dị mma ile anya, gosipụta njirimara Naịjirịa, nọtee aka, dị ọnụ ala ma gosipụtakwa ugwu nke Naịjirịa.
Kemgbe o kwuchara okwu a, ọtụtụ mmadụ kpụzi akwa adire n'ọnụ. Mana kedụ akwa a na-akpọ adire?
Adire bụ akwa ọdịnaala e tere uhie, nke ndị Yoruba na-arụpụta. Adire pụtara "nkechi na uhie" Bekee kpọrọ "tie and dye".
Ebe ndị a na-arụpụta adire na Naịjirịa gụnyere Abeokuta dị n'Ogun Steeti, Ịbadan dị n'Ọyọ Steeti, Oshogbo dị n'Ọshụn Steeti nakwa n'ụfọdụ mpaghara Kwara Steeti.
Ọtụtụ mmadụ nakwa ezinaụlọ dị iche iche na-eji akwa adire eme uwe njirimara maka agbamaakwụkwọ, nke a kpọrọ 'aso ebi' n'asụsụ Yoroba.
A na-eji adire egosipụta njirimara Naịjirịa n'emume ọdịnaala dị iche iche nakwa n'ụbọchị nkwụrụ na nke onwe.
Ụfọdụ mmadụ na-eyi akwa adire aga n'ụlọọrụ ha, ebe ụfọdụ na-ejikwa ya aga njem nleta.
Na nso nso a ka Gọọmenti Naịjirịa kwupụtara ụfọdụ mgbanwe maka ihe omume ndị ntorobịa ji otu afọ efe ala nna ha, nke otu n'ime ha bụ ịgbanwe uwe njirimara ha.



