Etu nnukwu ọgbakọ otu pati ADC si aga n'Abuja

Aha onyonyo, Etu nnukwu ọgbakọ otu pati ADC si aga n'Abuja
Etu nnukwu ọgbakọ otu pati ADC si aga n'Abuja

Pati African Democratic Congress' nke David Mark nọ n'isi ya, agaala n'ihu nwee nnukwu ọgbakọ ha n'isi obodo Abụja n'agbanyeghị esemokwu onyeisioche otu ahụ nakwa nsogbu inweta ogige ha ga-anọ mee ọgbakọ ahụ.

Ọgbakọ a na-abịa dịka a na-atụ anya mkpebi ụlọikpe mkpegharị banyere arịrọ David Mark n'akwụwkọ ikpe ọ gbara megide ikpe banyere onye bụ onyieisioche ADC.

Cheta na Nafiu Bala kpụpụrụ ADC n'ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ onyeisioche pati ahụ.

Na nnukwu ahụ nke mere n'ụbọchị 14 Eprel 2026, otu ADC gbara ọtụtụ ndị otu ha ụgbọ nwa mkpi bụ ndị ha boro ebubo ime ihe megide ọganihu nke pati ahụ.

Ndị a gụnyere Nafiu Bala Gombe, Stella Chukwuma, Leke Abejide, Kingsley Temitope Ogga na ndị ọzọ.