Gịnị mere Simon Ekpa ji laghachi n'ụlọikpe ka a tụchara ya mkpọrọ?
Simon Ekpa bụ onyendu otu alaka otu chọrọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Biafra Independent Movement alaghachịla n'ụlọikpe dị na mba Fịnland.
Ị ga-ajụ, kedụ ihe nwamadị a gara n'ụlọikpe ime?
Ekpa gara n'ụlọikpe mkpegharị bụ ebe ọ gbara akwụkwọ sị ka e leba anya n'ikpe ahụ ụlọikpe dị na mpaghara Päijät-Häme mba Fịnland mara ya ma tụọ ya mkpọrọ afọ isii n'ihi ime mpụ iyi ọha egwu n'ọnwa Sepụtemba afọ 2025.
Ụlọikpe a kwuru na Ekpa na-akwado mnwereonwe Biafra na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa site n'ụzọ megidere iwu, nke gụnyere iji soshal midia na ụzọ ndị ọzọ kpalie mmụọ ndị mmadụ ka ha na-eyi ndụ egwu nakwa isonye n'ihe ndị otu na-eyi ndụ egwu na-eme.
Mana Simon Ekpa gwara ụlọikpe mkpegharị na o nweghi ihe ọjọọ ọbụla o mere. O kwetere na ọ bụ ya hiwere otu Biafra Independence Movement ma bụrụ praịm mịnịsta gọọmentị ha gbara ọsọndụ a kpọrọ Biafra Government-in-exile.
Kama na usoro ya na ndị otu ya si achụso mnwereonwe Biafra etozughi iji sị na ha na-eme mpụ iyi ndụ egwu.
N'aka nke ọzọ, ndị ọkaiwu na-ama Ekpa ikpe chọrọ ka ụlọikpe mkpegharịa nyekwuo Ekpa ntaramahụhụ dị ukwuu karịa mkpọrọ afọ isii ahụ nke ụlọikpe nyeburu ya n'afọ gara aga.
Mkpegharị ikpe a malitere n'ụbọchị Mọnde abali iri na asaa nke ọnwa Ọgọst 2026 ebe ọ ga-ewe naanị izuụka atọ tupuu ọkaikpe achabie ikpe ya.
Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe anụla mkpesa Simon Ekpe nakwa nke ndị na-agba akaebe megide ya, a na-atụ anya na Ọkaikpe ụlọikpe mkpegharị ahụ ga-apịachi ikpe ahụ n'ọnwa Sepụtemba



