"Anaghị m ehi ụra n'abalị n'ihi ekpere m na-ekpe" - Pastọ Jerry Eze

"Anaghị m ehi ụra n'abalị n'ihi ekpere m na-ekpe" - Pastọ Jerry Eze
    • Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Pastọ Jerry gwara anyị etu ụlọụka Streams of Joy si malite dịka ọgbakọ Fellowship oge ọ nọ na mahadum ma kwuo na ndị maọbụ onye ọbụla na-ekwu na aka Chukwu adịghị n'ụlọụka ya, amaghị ụdịrị ekpere nne ya kpere n'isi ya oge ọ dị ndụ.

Pastọ Jerry Eze bụ onyeisi ụlọụka Streams of Joy, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC News Igbo nwere ma kọwaa na nkemye o nwere n'ekpere dị omimi.

Banyere ihe mere o ji kwenye n'ekpere, o kwuru na "Anya m ahụla ọtụtụ ihe ekpere nwereike ime na ndụ mmadụ".

Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị na-esonye n'ọgbakọ ekpere NSPPD ọ na-achịkọba enwetela ọtụtụ ihe ịrịbama site n'ikpe ekpere.

O mere ka o doo anya na enweghị ihe ọbụla nwereike ime ya ka ọ kwụsị ikpe ekpere.

O kwuru na ya na-ekpe ekpere kwa abalị ọbụla ma kọwaa na ya anaghị enwe ohere ime ọbụla ọzọ n'ihi oke ọrụ cheere ya.

Ọ kọwara na ọrụ ya dịka Pastọ bụ nke na-adịghị mfe.

"Nke bụ eziokwu bụ na onye ọbụla Chukwu kpọrọ oku ga-enwe ọtụtụ ihe ga-abịa ichere ya aka mgba, mana ọ dị mkpa ka onye di etu a kwenyesie ike na Chukwu ma ghara ịda mba", ka o kwuru.

Pastọ Jerry Eze ji ohere mkparịtaụka a kọwaara anyị etu o si malite ụlọụka Streams of Joy Church International n'afọ 2013.