Andy Burnham ekwupụtala ihe ọ ga-eme n'ime afọ iri dịka Praịm Minista mba Briten

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Praịm Minista mba Briten ọhụrụ bụ Andy Burnham ekwuola na mba ya kwesịrị ịdịkwu mma, ma kwuo na ya ga-ehiwe atụmatụ afọ iri maka mba Briten na ngwụcha afọ a.

Burnham kwupụtara nke a oge ọ na-ekwu okwu nnabata ya dịka Praịm Minista n'ụbọchị Mọnde 20 Julaị 2026.

O kwekwara nkwa na ya ga-akwụsị enweghị ụlọ obibi ma wunyekwuo ụlọ ọhanaeze, dịka o kelekwara ndịagha maka ịdị uchu ha.

Nke a na-eme dịka Burnham, onye a na-ahọpụta dịka Praịm Minista nke ise n'ime afọ anọ zara oku Eze kpọrọ ya n'Obieze Buckingham ka o hiwe gọọmenti ya.

Na mmalite ụbọchị Mọnde 20 Julaị 2026 ka Keir Starmer gbara arụkwaghịm, ma kwụọ na ya ji ezigbo amara na ihu ọchị na-apụ.

Ihe Andy Burnham sị na ya na-akwado dịka ọ ga-aghọ Praịm Mịnịsta mba Briten na Monde

Andy Burnham sị na ya ekpebibeghị ndị ga-abụ ndị imeobi ya dịka ọ na-akwado iweghara oche Praịm Mịnịsta n'aka Sir Keir Starmer n'ụbọchị Mọnde 20 Julaị, 2026

Oge a jụrụ ya ihe mere na ọ kpọpụtabeghị ndị ya na ya ga-arụkọ, onye ndu otu Labour ọhụrụ kwuru na: " Nke ahụ ga-abụzị imechu ihe emechu nke nwereike ibute ọgbaghara ma ọ bụrụ na ị banye n'ọkwa ghọgharịa ọrụ."

Akụkọ na-efegharị na-ekwu na Burnham na ọ họrọ Ed Miliband na Shabana Mahmood ndị e chere n'azọ ịnọchị Rachel Reeves dịka 'chancellor'.

N'okwu ya dịka ọ ghọchara onye ndu pati ya, Burham onye bụbụ meyo nke Greater Manchester kwụpụtara ebunaobi ya ihe ọ chọrọ nke gụnyere usoro nlekọta Bekee kpọrọ ' social care system'.

Burnham bụ onye laghachgharịrị n'ụlọomeiwu otu ọnwa gara aga dịka o meriri na ntuliaka mmeju e mere nke ọ bụ naanị ya bụ onye zọrọ ya bụ ebe o nwetara nwado ndị omewi nọ na otu 'Labour', nakwa nke otu azụmahịa 11.

ọ ga-eweghara ọkwa n'aka Keir n'ụbọchị Monde dịka Eze Charles lechara ya ọbịa.

Oge ndị ntaakụkọ jụrụ ya maka ndị ọ ga-ahọ na imeobi ya, Burnham sara sị, : "Ana m emetọpụ okwu gbara ya, nke m ga-ekpebi n'oge na-adịghị anya ma maa ọkwa ya ụbọchị Monde."