Ihe anyị ma maka ntọrị ndị ojiegbe tọọrọ Sir Joseph Ezeokafor

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe akụkọ banyere ntọrị a sị na ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor pụtara ihe, ọtụtụ mmadụ amalitela ịjụ ajụjụ banyere etu njiji a si mee.

Chief Joseph Ezeokafor bụ onyeisi ụlọọrụ Jezco Group bụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ ụgbọala dị iche iche.

Otu onye ya na ezinaụlọ Ezeokafor na-enwe ezi mmekọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor n'ụbọchị Tuzde 4 Ọgọst, 2026.

"Ndị ojiegbe bịara n'ogige ekpere dị n'Ifite Awka dị n'Anambra steeti ma tọrọ ya dịka ọ gara ebe ahụ iji sonye n'ekpere pụrụiche a na-eme oge ọ kụrụ elekere abụọ nke n'ụtụtụ Tuzde 4 Ọgọst, 2026," ka ọ gwara anyị.

"Kemgbe ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ya, ha akpọbeghị ndị ezinaụlọ Ezeokafor maọbụ onye ọbụla banyere ọnọdụ nna ha maọbụ kwuo ihe ha chọrọ".

Ọ gara n'ihu kwuo na ịhụnanya Chief Ezeokafor nwere n'ebe Chineke nọ mere o ji nyere aka rụọ ọtụtụ ọrụ gụnyere okporoụzọ, ụlọ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'ogige ekpere ahụ.

Banyere akụkọ n'efegharị na ọ bụ oge Chief Ezeokafor gara ịhụ nwaanyị ka ndị ojiegbe tọọrọ, nwaamadị ahụ kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị abụghị eziokwu.

"Chief Ezeokafor bụ onye nwere obi umeala dịka onye ụka Katọlik ma kwenye na o kwesghị ịkpọrọ ndị ọrụ nchekwa ya na-aga n'ogige ekpere ahụ, ọ bụ nke mere ndị ojiegbe ahụ ji nwee ohere ịtọrọ ya", ka o kwuru.

Ka ọ dị ugbua, ụbọchị Tuzde 11 Ọgọst, 2026 emeela ya otu izuụka ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor.

Onye bụ Chief Joseph Ezeokafor?

  • A mụrụ Chief Sir Joseph Ezeokafor n'ụbọchị Wenezde 30 Eprel, 1952 n'obodo Ekwulobia dị n'okpuruọchịchị Aguata, Anambra steeti.
  • Ọ bụ onye ji ego achụ ego a ma ama n'Anambra steeti nakwa na Naịjirịa gbaa gburugburu.
  • Chief Ezeokafor hiwere ụlọọrụ Jezco Oil n'afọ 1980.
  • N'afọ 1988, ụlọọrụ ahụ bụụrụ nke na-emepụta ma na-ere mmanụ ụgbọala dị iche iche na Naịjirịa.
  • Ọ gara n'ihu hiwekwa ụlọọrụ na-emepụta rọba na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
  • Ọ lụrụ Ada Ezeokafor onye mụtara ya ụmụaka asaa, ụmụnwoke abụọ na ụmụnwaanyị ise nke gụnyere Joseph Ezeokafor Jr. onye a maara dịka Jowizaza.
  • Ọ bụ onye na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka n'obodo ma na-arụkwa ọtụtụ ọrụ dị iche iche gụnyere ịgbapu mmiri, inye agụmakwụkwọ n'efu, nleta ahụike nakwa ihe ndị ọzọ n'obodo ya nakwa n'Anambra steeti.
  • E chiri ya echichi 'Nwachinaemelu Ekwuluobia' n'ihi ezi ọrụ ọ na-arụ n'obodo ya nakwa ọtụtụ ndị ọ na-enyere aka