Pantami, Adebutu na ndị ọzọ aha ha na-anọghị n'akwụkwọ Inec dịka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2027

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) na-ahụ maka ntuliaka na Nigeria wepụtara aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka 2027, akụkọ ekwuola na aha ọtụtụ ndị a ma ama adịghị na ndekọ akwụkwọ na-egosi ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ.

N'ihi aha ndị a, gbata gbata adaala na ọtụtụ pati ugbua, ebe ụfọdụ ṅụrụ iyi na ha ga-eme ihe niile ịhụ na ụlọọrụ Inec tighachiri aha ndị nke pati ha.

Pati ndị ihe ahụ kacha metụta gụnyere PDP, Nigeria Democractic Congress (NDC), African Democratic Congress (ADC) na ndị ọzọ amalitela ịgwa ụlọọrụ Inec na ha ekwetaghị na mwepụ ewepụrụ aha ndị nke ha.

Kedụ ndị aha ha apụtaghị dịka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ?

Ọkammụta Isa Pantami ji ọkọlọta PDP azọ ọkwa gọvanọ na Gombe steeti bụ otu n'ime ndị aha ha apụtaghị n'akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ.

Onye ọzọ bụ Oladipupo Adebutu ga-eji ọkọlọtọ pati PDP azọ ọkwa gọvanọ Ogun steeti, mana aha ya apụtaghị n'akwụkwọ ụlọọrụ Inec wepụtara.

Ndị ọzọ ụlọọrụ Inec ewepụtaghị aha ha gụnyere maka ịzọ ọkwa gọvanọ bụ Aminu Gwarzo bụ onye ga-eji ọkọlọtọ pati Nigeria Democractic Congress (NDC), azọ ọkwa gọvanọ na Kano steeti.

Sinatọ Danjuma Tella La'ah ga-eji ọkọlọtọ pati NDC azọ ọkwa gọvanọ na Kaduna steeti bụkwa onye ọzọ aha ya apụtaghị n'akwụkwọ ụlọọrụ Inec wepụtara ga-azọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.

Ọkammụta Sebastine Hon ga-eji ọkọlọtọ pati Social Democratic Party (SDP) zọọ ọkwa gọvanọ na Benue steeti bụkwa onye ọzọ aha ya apụtaghị n'akwụkwọ Inec wepụtara aha.

Ka ọ dị ugbu a, Adebutu na Pantami na ndị ọzọ aha ha apụtaghị agwala ndị otu ha ka ha dere jụụ n'ihi na pati ha na ụlọọrụ Inec nọ na-akparịtaụka ugbua iji tighachi aha ha n'akwụkwọ.

Kedụ ndị ọzọ ụlọọrụ Inec kọwara ihe mere aha ha apụtaghị?

N'aka nke ọzọ, nchọpụta BBC gosiri na e nwere ndị ọzọ ụlọọrụ Inec etinyeghị aha ha ma kọwaa ihe ha jiri mee ya etu ahụ.

Duwatsu Musa bụ onye ga-eji African Action Congress (ACC) zọọ ọkwa gọvanọ na Kwara steeti bụ onye ụlọọrụ Inec kwuru na ha wepụrụ aha ya n'ihi na o tozughị afọ iri atọ n'ise (35years) bụ afọ iwu obodo Nigeria kwadoro maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ.

Onye ọzọ bụ Aminu Ringim ga-eji ọkọlọtọ pati ADC azọ ọkwa gọvanọ na Jigawa steeti kwuru na ha anabataghi mwepụ ewepụrụ aha Ringim na mmadụ asaa ndị ọzọ ji ọkọlọtọ pati ha na-azọ ọkwa.

Onye mgbasaozi pati PDP bụ Jugundo Mohammed wepụtara ozi ma kwuo na ha na ụlọọrụ Inec na-akparịtaụka ugbua maka ya bụ ihe.

Otụtụ pati ndị ọzọ ewepụrụ aha ha gwara Inec ka ha werę ọsọ ọsọ tighachi aha ha n'akwukwọ ka udo wee chịa.