"Mbuze eriela ọtụtụ ụlọ anyị" ndị bi n'okporụzọ Agu n'Aba, Abịa steeti
- Onye dere ya, Nnachi Orji
- Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ Vidio
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ
- Mgbe e biputara ya
Nnukwu idemmiri na mbuze mere n'Aba dị n'Abịa Steeti n'ọnwa Julaị 2026.
Ka nnukwu mmiri zochara na-akwụsịghị akwụsị, ihe a metụtara ihe karịrị ụlọ iri abụọ, ebe ụlọ asatọ kụrụ n'ala n'akụkụ okporoụzọ Agu dị Aba, nke a mere ka ọtụtụ ndi mmadu ghahapụ ezinụlọ ha ma gbahapụ ụlọ obibi ha.
Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ihuigwe na Naịjirịa bụ NiMet dọrọ aka na ntị na mmalite afọ a, na Abịa Steeti ga-eso n'ebe mmiri ozuzo ga-ezo nke ukwuu n'afọ a.
Ha kwuru na mbuze a malitere ka na-arụ ọwammiri nke kwesiri iru n'osimiri Aba.
Ọnọdụ a mere ka idemmiri gbakọọ ebe ahụ ma malite igwu olulu.
Ugbua, ha na-akpọ oku ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka.
End of Akụkọ ndị a kachasị gụọ
Kedụ ihe ndị gọọmenti na-eme maka mbuze a?
Na nzaghachi, onyeisi ụlọọrụ Greater Aba Development Authority bụ Uche Ukaeje gwara BBC na ọ bụ oke mmiri ozuzu na-egbochi ọrụ na-aga n'ihu na mpaghara ahụ ma kwuo na gọọmenti steeti Abia steeti na-agbambọ iji belata mmetụta idemmiri nwere n'ebe ndị bi n'ebe ahụ nọ.




