Nwa okorobịa gburu nna ya bepụ ihe o ji bụrụ nwoke n'Anambra Steeti

Nwa okorobịa gburu nna ya bepụ ihe o ji bụrụ nwoke n'Anambra Steeti
Mgbe e biputara ya

Ị nụla maka nwokorobịa e boro ebubo na o gburu nna ya ma bepụ ihe o jiri bụrụ nwoke?

Lee ihe anyị ma.

Mkpu akwa n’ada ugbua n'obodo Isiama Igbo dị n’Agụlụ Anambra steeti n’ihi na a na-ebo otu nwokorobịa aha ya bụ Onyeka Nwajobi ebubo na o ji mma gbuo nna ya bụ Benji Ngana, bepụ ihe o ji bụrụ nwoke ma were ya gaa tinye n’arụsị.

Ndị obodo kwuru na arụ ahụ mere na Tọzde 9 Julaị, 2026 n’elekere itoolu nke abali.

Nwatakịrị ahụ kpara ajọ agwa ahụ gbara afọ iri abụọ n’otu.

Ihe onyonyo anyị nwetara gosiri oge ndi nche obodo jidere nwaokorobia ahụ a na-ebo mere ajọ ihe a, na-agba ya ajụjụ ọnụ.

Onyeka Nwajobi sara asịsa na ọ bụ ya na enyi ya nwoke jidere nna ya gbuo ya, o were mma bere ahụ nwoke ya gaa tinye n’arụsị Ududonka Agulu.

Onye isi ndị nche Isiamaigbo bụ Chikodi Chukwuemeka kọwaara na ha nwetara ozi na nwa Benji Ngana ji mma gbuo ya, nke a mere ha jiri gbaa mbọ nwudo ya kpụpụ ya n'Isiamaigbo town hall ebe ọ nọ kọọrọ ndị obodo ka o siri gbuo nna ya.

Ndị nche obodo mechara nyefee Onyeka na-aka ndị uweojii.