You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu m si malite udiri ejije m na-eme - Emma Nwanna
Onye na-eme ejije a ma nke ọma, na-emekwa ihe ịkpa amụ aha ya bụ Emmanuel Uzoma Okwara mana e ji Emma Nnwanna maọbụ Emma 'Mbe" mara akwuola etu o si malite ime udiri ejije ahụ.
Emma kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC nwere ebe ọ kọwara etu o si malite nakwa ihe ndị ọzọ..
Emma gwara BBC na ya bụ nwafọ obodo a na-akpọ Umutanze, Obo dị n'okpuru ọchịchị Orlu, Imo steeti.
Ọ kọwara na ya gụrụ akwụkwọ praịmarị n'Obo bụ obodo ya ma gụchaa ya n'Okon dị n'Akwa Ibom steeti.
Emma kọwara onwe ya dịka "onye na-eme ihe nkiri".
Etu m si bido ime ejije a
N'okwu Emma "ka m si bido ime ihe nkiri a bụ oge e nwere ndị chọrọ ime onyonyo. Ha na-acho onye ga-akpa agwa nkwarụ. Emma kwuru na ya so na ndị gosiri ọnatarachi ha n'ịkpa udiri agwa ahụ.
"Onye mbụ gosiri ịkpa agwa nkwarụ ya agafee, onye abụọ gafee mana mgbe onye nke atọ gafere ka e bịdọrọ na-akuru ya aka.
E jiri etu onye nke atọ ahụ si mee nwere mee nke m; ndị ahụ na-eme onyoonyo asị na m kacha mee ya. Ha ebido na-akpọ m "imbecile".
Etu ahụ ka ihe niile si bido.
Adịghị akọ ndị nwere nkwarụ ọnụ
Emma kwuru na ya ejighị onyonyo ya akọ onye ọbụla ọnụ kama na ya na-egosi na 'mmadụ inwe nkwarụ abụghị na nke onye ahụ agwụla'.
Ọ kọwara na ihe mere ndị mmadụ ji na-akpọrị ya ma na-ekwu na ya na-akọ ndị nkwarụ ọnụ bụ mgbe ha chọpụtara na ya abụghị onye nwere nkwarụ.
"Maka na m na-emete ya nke ọma. Ọtụtụ chere na m nwere nkwarụ; mana oge m tiri egwu ka ha chọpụtara na m abụghị onye nwere nkwarụ ha ebido na-ekwu ihe ha na-ekwu".
Emma kwuru na "enweghị oge ọbụla m kọrọ ndị nkwarụ ọnụ. Chukwu agaghị ekwe".