Ọ bụ eziokwu na ụlọikpe nyere iwu ka a nwụchie Rochas Okorocha?
Osuaghara adaala na APC n'ihi ozi kwuru na otu ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu ka a nwuchie Rochas Okorocha bụbu gọvanọ Imo State, Ifeanyi Ararume bụbu sịnetọ ndị Okigwe na mmadụ abụọ ndị ọzọ n'ihi ebubo ịkpa nkata ọjọọ na ịkụ akụrụakụ mpụtara ntuliaka imeụlọ APC.
Ozi ahụ, bụ nke ụfọdụ ndị enyemaka Gọvanọ Hope Uzodimma kesara n'ogbe nzirịtaozi soshal midịa kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 9 Septemba 2026 ka ụlọikpe nyere ya bụ iwu, n'ihi ebubo nrụrụaka, wuruwuru na mpịtọ ndị a hụtara n'oge ntuliaka imeụlọ APC haziri iji họpụta ndị ga-azọrọ ha ọkwa sịnetọ na mpaghara Orlu a maara dịka Imo West.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, INEC nabatara Hope Uzodimma dịka onye nwetara mmeri na ntuliaka imeụlọ ahụ, ma gwakwa ụlọọrụ nchekwa dị iche iche ka ha nyochaa akwụkwọ na-efegharị n'ịntanetị, bụ nke kwupụtara Okorocha dịka onye nwetara mmeri.
Ugbua, ndị mgbasaozi Rochas Okorocha apụtala, si mba ooo, ụmụnnaa ọ bụghịkwa eziokwu na ụlọikpe nyere iwu ka a nwuchie aka chịburu Imo State.
Nke a dị n'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi na onye ndụmọdụ pụrụiche nye Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo tinyere aka na ya. Onwuemeodo mara ndị na-ebugharị ozi ahụ aka n'ihu ka ha bipụta iwu ahụ ha sị ụlọikpe nyere, ka ọha ji anya ha hụ n'ime mkpụrụ ụbọchị abụọ.
Ọ chịlịrị aka na ụkwụ ya elu gọọ, sị na ọ bụghịkwa eziokwu na INEC kpọrọ aha Okorocha gbowam n'akwụkwọ mkpesa ha dere, kama ihe mere bụ na ha kpọrọ oku ka e nyochaa otu akwụkwọ na-adọ eriwe agwụagwụ.
Cheta na Rochas Okorocha na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri ntuliaka imeụlọ APC, dịka o kwuru na ya nwetara vootu 150,780 iji merie Hope Uzodimma ọ sị nwetara vootu 102,158 n'agbanyeghị na APC kwuru na Hope Uzodimma meriri ntuliaka ahụ, n'ihi na o nwetara vootu 230,464 ebe ha sị na Okorocha nwetara vootu 1,098.
N'ihi nke a, Okorocha gbara akwụkwọ n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja n'ụbọchị 13 Ọgọst 2026 na-achọ ka a kagbuo aha Uzodimma ma tinye aha nke ya onwe ya. Okorocha kwukwara na Uzodimma etozughị oke ịzọ ọkwa sịnetọ, n'ihi na ọ ka nọ n'oche dịka gọvanọ Imo State, bụ nke a tụrụ anya ga-abịa n'isi njedebe n'ọnwa Jenụwarị 2028.
Ka o ruru n'ọnwa Ọktoba, INEC wepụrụ akwụkwọ n'aka ndị uweojii nakwa DSS, ma kwuo na akwụkwọ ahụ na-efegharị ebe niile, bụ nke kwuru na ọ bụ Rochas Okorocha meriri ntuliaka imeụlọ APC bụ akụrụakụ nakwa adịgboroja.



